03 – Ụmụ mmadụ

Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Ụmụ mmadụ.

Top 3 Kasị Mkpa Amaokwu

Abụ Ọma 139:13-14

Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.

Ndị Galeshịa 3:28

E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.

Jenesis 6:11-12

Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike. Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.

Amaokwu ọ bụla n'usoro Canonical – 141 amaokwu

Jenesis 1:26-30

Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.” Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha. Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.” Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị. Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.”

Jenesis 2:7

ONYENWE ANYỊ Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ.

Jenesis 2:18

ONYENWE ANYỊ Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”

Jenesis 2:23-25

Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ. Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.

Jenesis 3:19

Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”

Jenesis 5:1-2

Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke. O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.

Jenesis 6:3

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.”

Jenesis 6:5-6

ONYENWE ANYỊ hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile. O wutere ONYENWE ANYỊ nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu.

Jenesis 6:11-12

Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike. Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.

Jenesis 8:21

ONYENWE ANYỊ nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.

Levitikọs 17:11

Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.

1 Samuel 2:6

“ONYENWE ANYỊ na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.

1 Samuel 16:7

Ma ONYENWE ANYỊ zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. ONYENWE ANYỊ adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma ONYENWE ANYỊ na-ele anya nʼobi.”

Job 1:21

kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. ONYENWE ANYỊ nyere ihe niile, ONYENWE ANYỊ ewerekwala ihe niile, ka aha ONYENWE ANYỊ bụrụ ihe a gọziri agọzi.”

Job 4:18-19

Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi, ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe, ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa, bụ ndị ntọala ha dị nʼaja, ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.

Job 8:9

Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.

Job 10:8-12

“Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m. Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m? Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ? Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ? Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ, werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe? I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị, nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.

Job 12:10

Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ

Job 14:1-2

“Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu. Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.

Job 14:5

Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.

Job 15:16

ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.

Job 16:22

“Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.

Job 25:6

ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”

Job 27:3-4

Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m, egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.

Job 33:4

Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.

Abụ Ọma 8:4

gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?

Abụ Ọma 8:5-8

I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

Abụ Ọma 14:1-3

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke. Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.

Abụ Ọma 24:1-2

Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke ONYENWE ANYỊ; ụwa na ndị niile bi nʼime ya. Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.

Abụ Ọma 33:13-15

ONYENWE ANYỊ si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya. O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya. Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.

Abụ Ọma 39:4-5

“O ONYENWE ANYỊ, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa. I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela

Abụ Ọma 39:11

Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. Sela

Abụ Ọma 51:5

Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.

Abụ Ọma 51:17

Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.

Abụ Ọma 53:1-3

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke. Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.

Abụ Ọma 78:39

Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.

Abụ Ọma 89:47-48

Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile! Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? Sela

Abụ Ọma 90:10

Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa, maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide, ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude, nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.

Abụ Ọma 90:12

Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.

Abụ Ọma 102:11-12

Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. Ma gị ONYENWE ANYỊ, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Abụ Ọma 103:14-16

nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja. Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.

Abụ Ọma 104:29

Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.

Abụ Ọma 115:16-17

Eluigwe niile bụ nke ONYENWE ANYỊ, ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile. Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto ONYENWE ANYỊ, ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;

Abụ Ọma 139:1-4

Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O ONYENWE ANYỊ, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. O ONYENWE ANYỊ, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.

Abụ Ọma 139:13-18

Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma. Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa. Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị. Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu. Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.

Abụ Ọma 144:4

Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.

Abụ Ọma 146:3-4

Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.

Ilu 11:20

ONYENWE ANYỊ na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.

Ilu 21:1-2

Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka ONYENWE ANYỊ, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma. Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya, ma ONYENWE ANYỊ bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.

Ilu 22:2

Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu ONYENWE ANYỊ onye kere ha niile.

Ekiliziastis 5:15

Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ.

Ekiliziastis 7:1

Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ. Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.

Ekiliziastis 7:20

Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume, ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.

Ekiliziastis 8:8

Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ. Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya. Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha, otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ.

Ekiliziastis 9:3

Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ.

Ekiliziastis 11:5

Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile.

Aịzaya 40:6-7

Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa. Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke ONYENWE ANYỊ na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.

Aịzaya 42:5

Nke a bụ ihe Chineke bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.

Aịzaya 44:24

“Otu a, ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ: Mụ onwe bụ ONYENWE ANYỊ, Onye kere ihe niile, onye gbatipụrụ eluigwe, onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m,

Aịzaya 51:12

“Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,

Aịzaya 53:6

Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ; onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya. Ma ONYENWE ANYỊ ebokwasịla ya ajọ omume anyị niile.

Aịzaya 55:8-9

“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.

Aịzaya 64:6-8

Anyị niile dịka onye rụrụ arụ, ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi. Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi, mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe. Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ; ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị. Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ, meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị. Ma otu ọbụla o si dị, gị ONYENWE ANYỊ bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.

Jeremaya 1:5

“Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị, tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ, ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.”

Jeremaya 16:12

Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi.

Jeremaya 17:5

Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ.

Jeremaya 17:9-10

Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya? “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”

Izikiel 18:4

Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.

Izikiel 36:26

Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.

Izikiel 37:5-6

Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ”

Matiu 9:36

Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ niile na-abịakwute ya, ọmịiko ha mere ya, nʼihi na ha bụ ndị a na-esogbu. Ndị na-enweghị onye inyeaka. Ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.

Matiu 10:30-31

Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha. Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.

Matiu 12:35

Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe.

Matiu 15:18-19

Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu.

Matiu 19:14

Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”

Matiu 26:41

Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.”

Mak 7:21-23

Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ, ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, ọchịchọ ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, ekworo, aghụghọ niile, adịghị ọcha niile, inwe anya ụfụ nʼebe ndị ọzọ nọ, nkwulu niile, nganga na enweghị uche ọbụla. Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”

Mak 10:6-9

Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’ ‘Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.’ Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”

Mak 10:18

Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke.

Luk 6:45

Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya.

Luk 12:7

Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.

Jọn 1:12-13

Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.

Jọn 2:24-25

Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nʼihi na ọ matara mmadụ niile nke ọma. Ọ dịghị ya mkpa ka onye ọbụla gbaa akaebe banyere ụmụ mmadụ, nʼihi na ya onwe ya maara ihe dị nʼime mmadụ.

Jọn 3:3-7

Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.” Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?” Ma Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke. Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ. Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’

Jọn 3:16

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

Jọn 3:19

Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.

Jọn 8:23-24

Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a. A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”

Ọrụ Ndị Ozi 17:25-28

Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile. O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya. ‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’

Ndị Rom 1:18

Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ.

Ndị Rom 1:22-24

Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu. Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala. Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha.

Ndị Rom 3:4

Ọ pụghị ịdị otu a! Kama ka ọ bụrụ ihe pụtara ihe na Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ niile bụ ndị okwu ụgha, dịka e dere ya, “Ka e nwe ike gosipụta na ị na-ekwu eziokwu mgbe ọbụla i kwuru okwu, na ekpegbukwa mgbe i na-ekpe ikpe.”

Ndị Rom 3:10-12

Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye. Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke. Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye.

Ndị Rom 3:23

Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.

Ndị Rom 5:12

Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela.

Ndị Rom 6:3-13

Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie. Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị. Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ. Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke. Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị. Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.

Ndị Rom 6:19

Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.

Ndị Rom 7:5

Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.

Ndị Rom 7:18

O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.

Ndị Rom 7:24

Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ?

Ndị Rom 8:3-9

Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ. Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị. Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ. Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo. Nʼihi na onye ọbụla tụkwasịrị uche ya nʼihe nke anụ ahụ na-ebuso Chineke agha, ọ naghị edebe iwu nke Chineke. Nʼeziokwu, ọ gaghị enwe ike idebe ya. Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya.

Ndị Rom 8:13

Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.

Ndị Rom 9:8

Nke a na-egosi na ọ bụghị ndị niile a mụrụ na-anụ ahụ bụ ụmụ Chineke, kama ụmụ ndị ahụ e kwere na nkwa bụ ndị a na-agụnye dị ka ụmụ Ebraham site na nkwa ahụ.

Ndị Rom 13:14

Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.

1 Ndị Kọrint 2:14

Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.

1 Ndị Kọrint 3:16-17

Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu? Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.

1 Ndị Kọrint 6:19-20

Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

1 Ndị Kọrint 15:21-22

Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa. Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst.

1 Ndị Kọrint 15:39

Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha.

1 Ndị Kọrint 15:42-50

Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike. A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ. E dere ya, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ, Adam nke ikpeazụ bụ mmụọ na-enye ndụ.” Ma mmụọ e bughị ụzọ, kama ọ bụ ahụ nkịtị, ma mmụọ bịara nʼikpeazụ. Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa. Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa. Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe. Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure.

2 Ndị Kọrint 4:16

Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.

2 Ndị Kọrint 5:1-4

Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe. Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe. Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ. Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a, anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi.

2 Ndị Kọrint 7:1

Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.

Ndị Galeshịa 3:28

E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.

Ndị Galeshịa 5:16-17

Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ. Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.

Ndị Galeshịa 5:24

Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.

Ndị Galeshịa 6:8

Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.

Ndị Efesọs 2:3

Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya.

Ndị Efesọs 4:18

Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa.

Ndị Filipai 1:21

Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru.

Ndị Filipai 3:3

Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.

Ndị Filipai 3:18-21

Nʼihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nʼanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nʼezie. Ọgwụgwụ ndị dị otu a ga-abụ ịla nʼiyi. Afọ ha bụ chi ha, ndị otuto ha dịkwa nʼihere ha. Ha na-atụkwasị uche naanị nʼihe nke ụwa. Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa. Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka ọ dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.

Ndị Kọlọsị 2:8

Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru.

Ndị Kọlọsị 3:11

Nkewa ọbụla adịghị nʼime ndụ a. Ọ dịghị mkpa maọbụ onye Juu maọbụ onye mba ọzọ, maọbụ onye e biri ugwu, maọbụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa maọbụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bu onye ime ọhịa, maọbụ onye Sitia, maọbụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ na Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa nʼime ihe niile.

1 Ndị Tesalonaịka 5:23

Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

1 Timoti 6:7

Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ.

2 Timoti 1:7

Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.

2 Timoti 3:2-5

Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya. Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ.

Taịtọs 1:15-16

Ihe niile dị ọcha nʼebe ndị dị ọcha nọ, o nweghị ihe ọbụla dị ọcha nʼebe ndị rụrụ arụ na ndị na-ekweghị ekwe nọ. Nʼihi na uche ha na akọnuche ha rụrụ arụ. Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla.

Ndị Hibru 2:6-8

Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya? Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze, dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.

Ndị Hibru 2:14-15

Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.

Ndị Hibru 4:12-13

Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ. Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.

Ndị Hibru 9:27

Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,

Jemis 1:14-16

Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ. Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m.

Jemis 2:26

Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.

Jemis 4:13-14

Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.” Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.

1 Pita 1:24

Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,

1 Pita 2:11

Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.

1 Jọn 2:15-17

Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa. Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

1 Jọn 3:1

Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.

Jud 1:23

Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.

Mkpughe 1:7

“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.” Otu a ka ọ ga-adị! Amen.

Igbo - Ìgbò - IG

IGBCB'20 - Igbo Contemporary Bible - 2020

This Bible text is from Biblica Open Igbo Contemporary Bible 2020
https://open.bible/bibles/igbo-biblica-text-bible/
provided by: Biblica Inc, available by Creative Commons CC-BY-SA-4.0,
and this new compilation is shared as www.creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0.
Languages are made available to you by www.ipedge.net