06 – Hel
Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Hel.
Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Hel.
Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ.
”Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile. Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.
”Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”
”Ma ONYENWE ANYỊ zara sị Mosis, “Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m. Ma ugbu a, duru ndị a gaa ebe ahụ m gwara gị. Mmụọ ozi m ga-edu unu nʼije a. Ma otu ọ dị, mgbe m bịara ileta ndị a, aga m ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
”Nʼihi na ONYENWE ANYỊ agaghị agbaghara onye dị otu a! Iwe ya, na ekworo ya, ga-adị ọkụ megide nwoke ahụ. Ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a ga-abịakwasịkwa ya. ONYENWE ANYỊ ga-ehichapụkwa aha ya, ka a ghara ịnụkwa ihe banyere ya nʼụwa.
”Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.
”Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.
”na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?
”Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.
”Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure.
”Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m.
”Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị. Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, ONYENWE ANYỊ ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.
”Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.
”Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.
”Ndị niile kpọrọ ONYENWE ANYỊ asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi.
”Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m.
”Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta, ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
”Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.
”ONYENWE ANYỊ na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi.
”Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.
”ONYENWE ANYỊ mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ?
”Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru.
”Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe. Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ.
”Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ.
”Ugbu a anụla ihe ndị a niile, ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu: Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile, nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe, ya na ihe nzuzo anyị niile, ma ha dị mma ma ha dị njọ.
”Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ. A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
”Ihe ga-amasị ya bụ egwu ONYENWE ANYỊ. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya. Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
”Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị ONYENWE ANYỊ dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu. Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri. Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha. Nʼihi na lee, ụbọchị ONYENWE ANYỊ na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.
”Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.
”Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.” Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị.
”Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala. Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu. Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.” Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.
”Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ; mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ. Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi; e chefukwaala ha.
”Lee anya! ONYENWE ANYỊ si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.
”Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
”Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.
”Nʼihi na lee, ONYENWE ANYỊ ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-eji ọkụ na mma agha ya kpee ndị mmadụ niile ikpe. Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.
”“Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”
”Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.
”“Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ.
”Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara. “ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam.
”Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi.
”“Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha.
”Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
”Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ.
”Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”
”“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’ Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ.
”Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ.
”“Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya. Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.
”Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ. Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya.
”“Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee. Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ejighị aha gị buo amụma, jiri aha gị chụpụ mmụọ ọjọọ, ma jirikwa aha gị ruo ọtụtụ ọrụ ebube?’ Mgbe ahụ aga m agwa ha hoohaa sị ha, ‘Amaghị m unu, sitenụ nʼihu m pụọ, unu ndị ajọ omume!’
”Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”
”Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.
”Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe. Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
”Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ. Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.
”Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”
”Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya.
”Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya? Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
”ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe.
”“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu emee ka otu nʼime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, jehie nʼokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume igwe nri nʼolu, tụnye ya nʼoke osimiri ka mmiri rie ya.
”Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ.
”“Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa. “Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
”“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ?
”Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.
”“Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’ “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’
”Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
”“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.
”“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ “Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ “Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”
”Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.”
”Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha? Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya?
”“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri. Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’ Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
”Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe.
”Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”
”Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Lijiọn,” nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis.
”Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya, maọbụ bụrụ onye a napụrụ ndụ ya?
”Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ! “Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.”
”Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu.
”Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi.
”Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, “Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ “Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ “Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ “Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi.
”“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile. Nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, otu nwoke onye ogbenye nke ọnya juru ahụ ya na-edina nʼebe ahụ. Aha ya bụ Lazarọs. Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ. “Mgbe onye ogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nʼebe Ebraham nọ. Onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya. Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya. Ọ kpọkuru Ebraham sị ya, ‘Nna m Ebraham, meere m ebere nʼihi na anọ m nʼoke ihe mgbu nʼime ọkụ a. Biko zienụ Lazarọs ka ọ denye mkpịsịaka ntakịrị ya na mmiri bịa mejụọ ire m.’ “Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ. A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’ “Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m, nʼihi na enwere m ụmụnne nwoke ise. Ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịbịa nʼebe a mmekpa ahụ dị.’ “Ebraham sịrị, ‘Ha nwere Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị.’ “Ma o kwuru, ‘Nna Ebraham, nke ahụ agaghị ezu! A sị na otu onye ga-esi nʼala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha egeghị Mosis na ndị amụma ntị, ha agaghị ekwenye ma a sịkwarị na mmadụ esi nʼọnwụ bilie.’ ”
”Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa. Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ. Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè.
”Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”
”“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe.
”Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa.
”nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.
”Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.
”Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ. Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya. Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị. Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.
”Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi. Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị. Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma.
”Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
”Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst. Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.
”Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.
”E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ” E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.
”Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ. Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu.
”Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nʼihi ihe ọjọọ niile o mere. Nʼihi na ile mmadụ anya nʼihu adịghị ya.
”Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya,
”Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,
”Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile. Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.
”Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe? Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.” Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ.
”Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya. Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ.
”Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi. Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ. Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.
”Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke; ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere (nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ). Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ. Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi karịrị ha nʼịdị ike, nweekwa ume karịa, ma ha anaghị e kpegide ha ikpe nkwujọ nʼihu Onyenwe anyị.
”Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.
”Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.
”Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
”Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.
”Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
”Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.
”Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi.
”Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ. Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi.
”Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.
”Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ.
”Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.
”Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ. Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe.
”Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya, ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya.
”Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.
”O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ. Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”
”Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa. Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile, na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”
”Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.” Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.”
”E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
”Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke. Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.”
”Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.
”Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ. Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.
”Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta. Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri. Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha. Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.
”Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha. Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị. Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ.
”Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”
”Ka ndị niile na-eme ajọ omume gaa nʼihu na-eme ajọ omume, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nʼihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nʼihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nʼihu bụrụ ndị dị nsọ.”
”Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a.
”