21 – Ofufe
Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Ofufe.
Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Ofufe.
Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’ bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.” Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”
”Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
”Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile! Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige ONYENWE ANYỊ; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ. Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela
”Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
”Melkizedek, eze Salem, onye nchụaja Chineke nke kachasị ihe niile elu, wepụtara achịcha na mmanya, ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa. Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.
”Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye ONYENWE ANYỊ Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị
”Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị,
”Nwoke ahụ hulatara ala kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ.
”Ehulatara m ala kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ. Etoro m ONYENWE ANYỊ, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, onye duru m nʼezi ụzọ inweta nwa nwanne nna m ukwu dịka nwunye nwa ya nwoke.
”Mgbe ohu Ebraham nụrụ ihe ha kwuru, ọ dara nʼala kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ.
”Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke ONYENWE ANYỊ mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ.
”Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”
”Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’ ”
”Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.
”ONYENWE ANYỊ ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị. Ma ogidi igwe ojii nʼehihie na ogidi ọkụ ahụ nʼabalị, ọ dịghị nke hapụrụ ọnọdụ ya nʼihu ha.
”Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha.
”Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru ONYENWE ANYỊ abụ dị otu a sị, “Aga m abụku ONYENWE ANYỊ abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri. “ONYENWE ANYỊ bụ ike m na abụ m. Ọ ghọrọla m nzọpụta. Ọ bụ Chineke m, aga m etokwa ya, Chineke nke nna m, aga m ebulikwa ya elu.
”Aka nri gị ONYENWE ANYỊ, dị ike, dịkwa ebube. Aka nri gị, ONYENWE ANYỊ na-etipịasị ndị iro. “Nʼoke ike nke ịdị elu gị, Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị. I zipụrụ iwe gị dị ọkụ, o repịara ha dịka igbugbo ọka.
”Onye dịka gị ONYENWE ANYỊ, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube?
”“ONYENWE ANYỊ ga-abụ eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”
”Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube ONYENWE ANYỊ ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii.
”ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke ONYENWE ANYỊ gwara ya.
”Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji. Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute Chineke. Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ. Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! ONYENWE ANYỊ rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ.
”Ngwangwa, Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ, oke igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ niile, ebube ONYENWE ANYỊ kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, ONYENWE ANYỊ sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku. Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube ONYENWE ANYỊ na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ. Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
”Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel.
”Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe ONYENWE ANYỊ na Mosis na-akparị ụka. Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala. Nʼime ụlọ nzute ahụ, ONYENWE ANYỊ na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ.
”Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”
”Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.” Ma ONYENWE ANYỊ zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ ONYENWE ANYỊ pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko. Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo. Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara. Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”
”Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ ONYENWE ANYỊ. O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “ONYENWE ANYỊ, ONYENWE ANYỊ, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.” Otu mgbe ahụ, Mosis hulatara kpọọ isiala,
”Unu efela chi ọzọ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ, onye aha ya bụ Ekworo, bụ Chineke na-ekwo ekworo.
”Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube ONYENWE ANYỊ jupụtakwara nʼime ya. Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.
”Igwe ojii ONYENWE ANYỊ ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.
”Mosis na Erọn bara nʼime ụlọ nzute. Mgbe ha pụtara, ha gọziri ọha mmadụ ahụ. Mgbe ahụ kwa, ebube ONYENWE ANYỊ pụtara ìhè nye mmadụ niile nʼọgbakọ ahụ. Ọkụ sitekwara nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ daa, rechapụ aja nsure ọkụ ahụ, na abụba ahụ dị nʼebe ịchụ aja. Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha tiri mkpu ọṅụ. Daa, kpuo ihu nʼala.
”ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, “Gwa nwanne gị nwoke Erọn si ya ka ọ ghara ịbata mgbe ọbụla ọ chọrọ, nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ nke dị nʼazụ akwa mgbochi, nke dị nʼihu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-anwụ. Nʼihi na aga m apụta ìhè nʼime igwe ojii dị nʼelu ebe mkpuchi ahụ.
”Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya. Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ.
”Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube ONYENWE ANYỊ.
”Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube ONYENWE ANYỊ pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
”Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube ONYENWE ANYỊ pụtakwara ihe.
”Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube ONYENWE ANYỊ anya.
”Mgbe ahụ ka ONYENWE ANYỊ meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya.
”amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.
”O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya. O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ.
”Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.
”Unu sịrị, “ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị egosila anyị ebube ya, na ịdị ukwu ya, anyị anụkwala olu ya site nʼime ọkụ ahụ. Taa anyị ahụla na mmadụ pụrụ ịdị ndụ ọbụladị ma Chineke kpanyere ha ụka.
”Nụrụ gị Izrel, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị, ONYENWE ANYỊ bụ otu. Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị nʼanya.
”Nʼihi na ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke unu bụ Chineke kachasị chi niile, bụrụkwa Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. Chineke ukwu ahụ, onye dị ike dịkwa egwu, onye na-adịghị ele mmadụ anya nʼihu, ọ nakwaghị eri ngarị.
”Tụọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị egwu, feekwa ya ofufe. Ya ka ị ga-arapara nʼahụ, ọ bụkwa naanị nʼaha ya ka ị ga-aṅụ iyi. Ọ bụ ya bụ onye ị ga-eto otuto, ọ bụ ya bụ Chineke gị, onye rụrụ gị ọrụ ndị ahụ dị oke egwu na ebube, nke gị onwe gị ji anya gị hụ.
”Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị,
”Aga m eto aha ONYENWE ANYỊ toonu ịdị ukwuu Chineke anyị! Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke, ụzọ ya niile ziri ezi. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.
”“Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya! Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m. Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ. Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya, mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m.
”“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’
”Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha ONYENWE ANYỊ.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?” Ọchịagha usuu ndị agha ONYENWE ANYỊ zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.
”Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha. Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.”
”Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.
”Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha.
”“Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke Izrel.
”Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.” Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, ONYENWE ANYỊ mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya: Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala.
”“O nweghị onye dị nsọ dịka ONYENWE ANYỊ; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
”Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu.
”Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu ONYENWE ANYỊ, o ledara ya anya nʼime obi ya.
”“Akpọkuru m ONYENWE ANYỊ; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
”ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
”Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto.
”Mgbe ndị nchụaja si nʼEbe Nsọ ahụ pụta, igwe ojii jupụtara ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ ahụ. Ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼime ụlọnsọ ya.
”Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ chilie ha elu, kwuo sị, “ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe nke dị nʼelu, maọbụ nʼụwa, nʼokpuru eluigwe. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
”“Ma ọ bụ ezie na gị Chineke ga-ebi nʼelu ụwa? Lee, eluigwe ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị?
”Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “ONYENWE ANYỊ, ya onwe ya bụ Chineke! ONYENWE ANYỊ ya onwe ya bụ Chineke!”
”Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ. Ahụrụ m ONYENWE ANYỊ ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
”Hezekaya kpere ekpere nye ONYENWE ANYỊ, sị, “O, ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.
”Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu.
”Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.
”Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ. Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.
”Nyenụ ONYENWE ANYỊ otuto, kwupụtakwa aha ya, meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto; kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile. Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ ONYENWE ANYỊ ṅụrịa ọṅụ. Na-achọnụ ONYENWE ANYỊ na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
”Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ, unu ụwa niile; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ. Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa. Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ ONYENWE ANYỊ kere eluigwe niile. Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya. Nyenụ ONYENWE ANYỊ, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ na ike. E, nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ ruuru aha ya, werenụ onyinye bịa nʼihu ya. Kpọọnụ isiala nye ONYENWE ANYỊ nʼịma mma nke ịdị nsọ ya. Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya. Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “ONYENWE ANYỊ na-achị.” Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Keleenụ ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.” Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu ONYENWE ANYỊ.”
”Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ ịbụ abụ otuto, na ekele.
”Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere ONYENWE ANYỊ ekele sị, “Otuto dịrị gị ONYENWE ANYỊ Chineke nna anyị Izrel site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile. Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike. Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube.
”Mgbe ndị nchụaja sitere nʼEbe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ pụta, nʼihi na ndị nchụaja ahụ niile doro onwe ha nsọ nʼagbanyeghị usuu nke onye ọbụla nʼime ha si pụta. Ma ndị Livayị bụ ndị ọbụ abụ, ya bụ Asaf, Heman, Jedutun na ụmụ ha ndị ikom na ndị ikwu ha guzoro onwe ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja. Ha yi uwe ezi akwa ọcha ma na-akpọ ụbọ akwara, na-akụkwa ogene ọla. Ndị nchụaja dị otu narị na iri abụọ (120) nʼọnụọgụgụ. Ndị na-afụ opi sokwa ha. Ndị ọbụ abụ ahụ na ndị na-afụ opi jikọrọ onwe ha ọnụ were otu olu bụkuo ONYENWE ANYỊ abụ ekele na otuto. Ndị na-afụ opi, na ndị na-akụ ọla na-ada ụda, na ndị ji ngwa egwu ndị ọzọ sonyeere ha, welie olu ha elu too ONYENWE ANYỊ nʼabụ sị: “Nʼihi na Ọ dị mma Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Mgbe ahụ igwe ojii jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, nke mere na ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼime ụlọnsọ Chineke.
”Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ. Solomọn ji bronz kpụọ ihe nrigoro ịnọ gwa ọha mmadụ okwu. Ogologo ihe nrigoro ahụ, obosara ya ruru mita abụọ na ọkara mita abụọ na ọkara. Ịdị elu ya ruru otu mita na ọkara. O debere ya nʼetiti ebe mpụta nke ogige ụlọnsọ ukwu ahụ. O guzoro nʼelu ihe nrigo ahụ, nʼihu ọgbakọ Izrel niile, gbuo ikpere nʼala, gbasaa aka ya abụọ chilie ha elu. Ọ sịrị, “ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
”“Ma ọ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ nʼelu ụwa? Lee, eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị!
”Ngwangwa, mgbe Solomọn kpesịrị ekpere a, ọkụ sitere nʼeluigwe daa repịa aja nsure ọkụ ahụ na aja ahụ niile. Ebube ONYENWE ANYỊ jupụtakwara nʼụlọnsọ ukwu ahụ, Ndị nchụaja enweghị ike ịbanye nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ nʼihi ebube ONYENWE ANYỊ nke jupụtara ụlọnsọ ahụ. Mgbe ọha ndị Izrel niile hụrụ ọkụ ahụ si nʼelu daa, hụkwa ebube ONYENWE ANYỊ ka o guzo nʼelu ụlọnsọ ukwu ahụ, ha dara nʼala kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ, kelee ya ekele sị: “Nʼihi na Ọ dị mma ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
”Ndị nchụaja guzo nʼihu ọrụ ha, ha na ndị Livayị. Ha jiri ngwa egwu ONYENWE ANYỊ nke eze Devid mere maka ị na-eto ONYENWE ANYỊ, bụkwa nke o ji mgbe o nyere ekele, na-asị, “Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Na ncherita ihu ndị Livayị, ndị nchụaja fụrụ opi ike ha mgbe ndị Izrel guzooro ọtọ.
”Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ: Ahụrụ m ONYENWE ANYỊ ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
”Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too ONYENWE ANYỊ nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ ONYENWE ANYỊ ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”
”Eze Hezekaya na ndịisi ozi ya nyere iwu ka ndị Livayị bụọ ụfọdụ nʼime abụ ọma Devid, na nke Asaf onye amụma, maka iji ya too ONYENWE ANYỊ. Ha mere otu a, kpọọkwa isiala nye Chineke.
”Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu ONYENWE ANYỊ too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
”Mgbe ndị na-ewu ụlọ tọrọ ntọala ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ahụ, ndị nchụaja ahụ niile yii uwe ha jide opi nʼaka. Otu a kwa ndị Livayị, ụmụ ndị ikom Asaf jikwa ogene ha na-eto ONYENWE ANYỊ dịka usoro iwu Devid, eze Izrel nyere ha si dị. Ha ji abụ otuto na ekele bụkuo ONYENWE ANYỊ abụ sị: “Ọ dị mma, ịhụnanya ya nʼebe Izrel nọ na-adị ruo ebighị ebi.” Mmadụ niile jiri oke olu too ONYENWE ANYỊ nʼihi ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ ha tọrọ.
”Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo ONYENWE ANYỊ Chineke m
”Mgbe ahụ, Ezra gọziri ONYENWE ANYỊ Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ.
”Mgbe ahụ Jeshua, Bani, Kadmiel, Shebanaya, Buni, Sherebaya, Bani na Kenani rigoro guzo nʼelu ihe nguzo ndị Livayị. Ha jiri oke olu kpọkuo ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ha. Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, “Bilienụ ọtọ, too ONYENWE ANYỊ Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.” “Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile. Gị onwe gị, naanị gị bụ ONYENWE ANYỊ. Gị kere eluigwe, ọ bụladị eluigwe kachasị elu, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, ụwa na ihe niile dị nʼime ya, oke osimiri niile na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị na-enye ihe niile ndụ, usuu niile nke eluigwe na-akpọkwa isiala nye gị.
”“Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile.
”Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.
”Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke.
”Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. ONYENWE ANYỊ nyere ihe niile, ONYENWE ANYỊ ewerekwala ihe niile, ka aha ONYENWE ANYỊ bụrụ ihe a gọziri agọzi.”
”“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile. Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.
”“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?
”“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,
”Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ. Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke. Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!
”Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma. Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.
”“E buliela Chineke elu nʼike ya, onye bụ onye ozizi dịka ya? Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso, maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’? Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu, bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.
”“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji, na-amali elu site nʼọnọdụ ya. Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya, na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta. Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile, ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ. Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya; ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe, mgbe olu ahụ dara dakwasị, ọ naghị egbochi amụma igbu egbu. Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe; ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.
”Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe, nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
”Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa. Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu, nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.
”Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị. Onyenwe anyị na-akwa ha emo.
”“Mụ onwe m eguzobela m eze m na Zayọn, ugwu m dị nsọ.”
”Aga m enye ONYENWE ANYỊ ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha ONYENWE ANYỊ, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
”Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O ONYENWE ANYỊ Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe.
”O ONYENWE ANYỊ, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
”Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. O ONYENWE ANYỊ, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme. Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
”Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
”ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
”ONYENWE ANYỊ bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
”ONYENWE ANYỊ nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; ONYENWE ANYỊ nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.
”Aga m abụku ONYENWE ANYỊ abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
”Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị,
”Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu ONYENWE ANYỊ. Ọ bụụrụ ONYENWE ANYỊ okwu niile nke abụ a mgbe ONYENWE ANYỊ napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O ONYENWE ANYỊ, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. ONYENWE ANYỊ bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. Akpọkuru m ONYENWE ANYỊ, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
”ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
”Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ ONYENWE ANYỊ bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYỊ? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
”ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.
”Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
”O ONYENWE ANYỊ, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.
”Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.
”Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto. Toonu ONYENWE ANYỊ! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel! Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya. Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ ONYENWE ANYỊ ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute ONYENWE ANYỊ. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya. Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke ONYENWE ANYỊ, ọ na-achịkwa mba niile. Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
”Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata. Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, onye bụ dike nʼagha. Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa. Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela
”Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka ONYENWE ANYỊ, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ ONYENWE ANYỊ ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma ONYENWE ANYỊ, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
”Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye ONYENWE ANYỊ. Gee ntị mgbe m na-akpọku gị ONYENWE ANYỊ. Meere m ebere, zaa m. Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, ONYENWE ANYỊ, ka m ga-achọ.
”ONYENWE ANYỊ bụ ike m na ọta m; ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, aga m ejikwa abụ m na-eto ya.
”Abụ Ọma Devid. Toonu ONYENWE ANYỊ, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. Nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye ONYENWE ANYỊ nʼebube nke ịdị nsọ ya. Olu ONYENWE ANYỊ na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu ONYENWE ANYỊ na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri. Olu ONYENWE ANYỊ dị ike, olu ONYENWE ANYỊ jupụtakwara nʼebube.
”Olu ONYENWE ANYỊ na-eme ka osisi ook gbagọọ na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” ONYENWE ANYỊ nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; ONYENWE ANYỊ na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
”Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya.
”I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O ONYENWE ANYỊ Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
”Tienụ mkpu ọṅụ nye ONYENWE ANYỊ, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. Werenụ ụbọ akwara too ONYENWE ANYỊ; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.
”Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto ONYENWE ANYỊ mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. Mkpụrụobi m ga-anya isi na ONYENWE ANYỊ; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. Soro m too ONYENWE ANYỊ; ka anyị bulie aha ya elu.
”Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
”Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie ONYENWE ANYỊ elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.” Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.
”O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime ONYENWE ANYỊ.
”Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “ONYENWE ANYỊ dị ukwuu.”
”Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m, mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen na Amen.
”Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?
”Nʼehihie, ONYENWE ANYỊ na-awụkwasị m ịhụnanya ya, nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, ekpere nye Chineke nke ndụ m.
”Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.
”Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe. Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
”O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
”Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
”Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
”Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
”Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. ONYENWE ANYỊ ewerela olu opi ike rigoo. Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto. Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya. Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile. Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
”Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora. ONYENWE ANYỊ dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.
”Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.
”“Chụọrọ Chineke aja ekele, mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu, ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị, aga m agbapụta unu, unu ga-enyekwa m nsọpụrụ.”
”Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m, ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya, ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke.”
”O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.
”O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
”Obi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.
”Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-adabere.
”Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.
”Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.
”Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.
”Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ. I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
”Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke! Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube! Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela
”Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;
”Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto, toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, ONYENWE ANYỊ bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
”elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
”Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa, bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, Sela Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe. Kwusaa ike Chineke, onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel, onye ike ya dị nʼeluigwe. O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị; Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike. Toonu Chineke!
”Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.
”Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.
”Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “ONYENWE ANYỊ dị ukwuu.”
”Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị. Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike. Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
”Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.
”O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị Onye nsọ nke Izrel. Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara.
”Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya, ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.
”Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, mba niile ga-ejekwara ya ozi.
”Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. A ga-esite na ya gọzie mba niile, a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi. Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ Chineke, Chineke nke Izrel, onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche. Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; ka ụwa niile jupụta nʼebube ya. Amen na Amen.
”Aga m echeta ọrụ niile ONYENWE ANYỊ rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga. Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.” O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ. Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị? Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
”O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
”Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
”Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ nke Asaf nʼusoro gittit. Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ, tikusie Chineke Jekọb mkpu ike! Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une.
”Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.
”Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile! Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige ONYENWE ANYỊ; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ. Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela
”Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube. Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke. Kuziere m ụzọ gị, O ONYENWE ANYỊ, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.
”Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”
”anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O ONYENWE ANYỊ, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
”Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya ONYENWE ANYỊ ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
”O ONYENWE ANYỊ, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere ONYENWE ANYỊ? Onye yiri ONYENWE ANYỊ nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
”Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
”Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu. Nʼezie, ọta anyị bụ nke ONYENWE ANYỊ, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.
”Ekpere Mosis, bụ onyeozi Chineke. O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị nʼọgbọ niile. Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.
”Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
”Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. Ọ bụ ihe ziri ezi ito ONYENWE ANYỊ, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,
”ONYENWE ANYỊ bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; ONYENWE ANYỊ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. Oke osimiri niile amaliela elu, O ONYENWE ANYỊ; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ. ONYENWE ANYỊ onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri. Ụkpụrụ gị niile, ONYENWE ANYỊ na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
”Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo ONYENWE ANYỊ abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.
”Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu ONYENWE ANYỊ, onye kere anyị;
”Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ ọhụrụ, bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ, unu ụwa niile. Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ. Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa. Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ ONYENWE ANYỊ kere eluigwe niile. Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya. Nyenụ ONYENWE ANYỊ, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ na ike. Nyenụ ONYENWE ANYỊ nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya. Kpọọnụ isiala nye ONYENWE ANYỊ nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “ONYENWE ANYỊ na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe. Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya. Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ. Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.
”ONYENWE ANYỊ bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.
”Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihu Onyenwe ụwa niile. Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.
”Nʼihi na gị, O ONYENWE ANYỊ, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.
”Abụ Ọma. Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta.
”Tikusienụ ONYENWE ANYỊ mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ; werenụ ụbọ akwara bụkuo ONYENWE ANYỊ abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma, jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu ONYENWE ANYỊ, Onye bụ Eze. Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya. Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
”ONYENWE ANYỊ bụ eze, ka mba niile maa jijiji! O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim, ka elu ụwa maa jijiji. ONYENWE ANYỊ dị ukwuu nʼime Zayọn; ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche. Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu, ọ dị nsọ. Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya, i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike; nʼime Jekọb ka i mere ihe ziri ezi na ihe dị mma. Bulienụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ.
”Bulienụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka ONYENWE ANYỊ Chineke anyị bụ.
”Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. Tikusienụ ONYENWE ANYỊ mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. Jiri obi ụtọ fee ONYENWE ANYỊ ofufe; jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya Matanụ na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke. Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị, anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
”Abụ Ọma Devid. Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o ONYENWE ANYỊ, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.
”Mba niile ga-atụ egwu aha ONYENWE ANYỊ, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.
”Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.
”Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYỊ; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYỊ; echefukwala mmeso ọma ya niile,
”ONYENWE ANYỊ emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile.
”Toonu ONYENWE ANYỊ, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi. Toonu ONYENWE ANYỊ unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya. Toonu ONYENWE ANYỊ, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị. Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYỊ.
”Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYỊ. O ONYENWE ANYỊ na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe. Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
”ONYENWE ANYỊ, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.
”Ka ebube ONYENWE ANYỊ dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka ONYENWE ANYỊ niile wetara ya ọṅụ, onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ. Aga m abụku ONYENWE ANYỊ abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m; aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ. Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYỊ. Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too ONYENWE ANYỊ gị mkpụrụobi m! Toonu ONYENWE ANYỊ!
”Nyenụ ONYENWE ANYỊ otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ. Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile. Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ ONYENWE ANYỊ ṅụrịa. Na-achọnụ ONYENWE ANYỊ na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
”Toonu ONYENWE ANYỊ. Keleenụ ONYENWE ANYỊ nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke ONYENWE ANYỊ na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile?
”O ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị. Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ka mmadụ niile sị, “Amen!” Toonu ONYENWE ANYỊ.
”Keleenụ ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
”Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye.
”Abụ, Abụ Ọma Devid. Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu. Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ. Aga m eto gị, O ONYENWE ANYỊ, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
”Aga m eji ọnụ m jaa ONYENWE ANYỊ mma nke ukwuu; nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya.
”Toonu ONYENWE ANYỊ! Aga m eji obi m niile jaa ONYENWE ANYỊ mma nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. Ọrụ niile ONYENWE ANYỊ na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
”O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu. Ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
”Toonu ONYENWE ANYỊ! Toonu ONYENWE ANYỊ unu ndị ohu ya. Toonu aha ONYENWE ANYỊ. Ka aha ONYENWE ANYỊ bụrụ ihe a gọziri agọzi site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya, aha ONYENWE ANYỊ ga-abụ ihe a na-eto eto.
”ONYENWE ANYỊ dị elu karịa mba niile, ebube ya dị elu karịa eluigwe. Onye dị ka ONYENWE ANYỊ Chineke anyị, onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu, onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị eluigwe na ụwa anya?
”Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o ONYENWE ANYỊ, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.
”ọ bụ anyị ga-aja ONYENWE ANYỊ mma, site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonu ONYENWE ANYỊ.
”Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha ONYENWE ANYỊ. Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi ONYENWE ANYỊ nkwa m kwere, nʼime ogige ụlọ ONYENWE ANYỊ, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu ONYENWE ANYỊ.
”Toonu ONYENWE ANYỊ, unu mba niile dị iche iche. Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. Ikwesi ntụkwasị obi ONYENWE ANYỊ na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. Toonu ONYENWE ANYỊ!
”Ka ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”
”Aka nri ONYENWE ANYỊ bụ ihe e weliri elu; aka nri ONYENWE ANYỊ emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!”
”Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m. Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ; nke a bụ ọrụ aka ONYENWE ANYỊ, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị. Nke a bụ ụbọchị ONYENWE ANYỊ anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
”Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu. Keleenụ ONYENWE ANYỊ nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
”Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.
”Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.
”Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi.
”Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.
”“Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
”Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya ma toonu ONYENWE ANYỊ.
”Toonu ONYENWE ANYỊ. Toonu aha ONYENWE ANYỊ, toonu ya, unu ndị ohu ONYENWE ANYỊ niile, unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ ONYENWE ANYỊ, nʼime ogige ụlọ Chineke anyị. Toonu ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ dị mma; bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi.
”Ka otuto dịrị ONYENWE ANYỊ site na Zayọn, nye onye ahụ na-ebi na Jerusalem. Toonu ONYENWE ANYỊ.
”Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
”Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
”Abụ Ọma Devid. O ONYENWE ANYỊ, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile. Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. O ONYENWE ANYỊ, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu. Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ebube ONYENWE ANYỊ dị ukwuu.
”Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.
”Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela
”O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;
”Abụ Ọma otuto, nke Devid. Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. ONYENWE ANYỊ dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta. Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche. Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile. Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile. Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị.
”O ONYENWE ANYỊ, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị. Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. ONYENWE ANYỊ na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
”Ọnụ m ga-ekwupụta otuto ONYENWE ANYỊ; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.
”Toonu ONYENWE ANYỊ. O mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYỊ. Aga m eto ONYENWE ANYỊ ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.
”ONYENWE ANYỊ na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu ONYENWE ANYỊ.
”Toonu ONYENWE ANYỊ! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
”Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu. Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ. ONYENWE ANYỊ na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala. Jirinụ ekele bụkuo ONYENWE ANYỊ abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
”Toonu ONYENWE ANYỊ. Toonu ONYENWE ANYỊ site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu. Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile. Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile. Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe. Ka ha niile too aha ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya. O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.
”Toonu ONYENWE ANYỊ, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile, na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu, unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile, ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa, ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị. Ka ha niile too aha ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.
”Toonu ONYENWE ANYỊ! Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ ọhụrụ. Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha. Ka ha jiri ite egwu too aha ya ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ. Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha,
”Toonu ONYENWE ANYỊ. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya. Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile. Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya, jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya, werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya. Ka ihe niile na-eku ume too ONYENWE ANYỊ. Toonu ONYENWE ANYỊ.
”Nʼihi na ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
”Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?
”Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ, nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya. Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma, aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta, ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya. Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
”Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?
”Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu; bịakwa gị ifufe si na ndịda, fekwasị ubi m a gbara ogige, ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile, ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige, ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.
”Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe ONYENWE ANYỊ, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
”Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu ONYENWE ANYỊ, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
”Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
”Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha.
”Ma ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
”Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya. Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị. Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.” Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ. Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!”
”Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
”Mmụọ ONYENWE ANYỊ ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ.
”Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ ONYENWE ANYỊ otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”
”Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha, nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ.
”Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ; ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke ONYENWE ANYỊ. Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye ONYENWE ANYỊ otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel elu.
”O ONYENWE ANYỊ, ị bụ Chineke m; aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto, nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke, ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama, nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga. Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe; mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ; meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi, agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị. Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu.
”Tụkwasị ONYENWE ANYỊ Chineke obi mgbe niile, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.
”Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya, ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ okpueze mara mma, ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma.
”Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ ONYENWE ANYỊ, na-agakwuru Oke Nkume Izrel. ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.
”Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
”Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ onye ikpe anyị. ONYENWE ANYỊ bụ onye na-enye anyị iwu. ONYENWE ANYỊ bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị.
”Ma ndị ahụ ONYENWE ANYỊ gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.
”ONYENWE ANYỊ ga-azọpụta m, anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwara nʼụbọchị niile nke ndụ anyị, nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ.
”Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya.”
”Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
”Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa? Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu. Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana. Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa, were ya mere ebe obibi ya. Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa, mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
”Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.
”Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
”Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYỊ, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.
”“Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ! Nke a bụkwa aha m. Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m. Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m. Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.” Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu. Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike. Ka ha nye ONYENWE ANYỊ ebube, kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu.
”onye ọbụla nke a na-akpọ aha m, onye m kere nʼihi otuto m, onye m kpụrụ, ma meekwa.”
”“Unu bụ ndị akaebe m,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “bụrụkwa ndị ohu m họpụtara, ka unu mara m, ma kwerekwa na m, ghọtakwa na Mụ onwe m bụ onye ahụ. Ọ dịghị chi a kpụrụ tupu m dịrị, ọ dịkwaghị nke ga-eso m nʼazụ. Mụ, ọ bụ na naanị m, bụ ONYENWE ANYỊ, ọ dịkwaghị onye nzọpụta ọzọ dị ma ewezuga m.
”Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, Onye nsọ gị, onye kere Izrel, Eze unu.”
”Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
”“Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ na-ekwu, onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile: Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.
”Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na ONYENWE ANYỊ emeela ya; tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala. Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile, unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ agbapụtala Jekọb, na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.
”Ọ bụ m bụ ONYENWE ANYỊ, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike. Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m ONYENWE ANYỊ, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ, na-eme ihe ndị a niile.
”Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
”“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị. Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.
”Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga, nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa. Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m. Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’
”Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye nsọ Izrel.
”“Geenụ m ntị, gị Jekọb, na gị Izrel onye m kpọrọ. Mụ onwe m bụ onye ahụ; Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ. Ọ bụ aka m tọrọ ntọala ụwa. Ọ bụkwa aka nri m gbasara eluigwe. Mgbe m kpọrọ ha oku ha na-abịa guzo nʼihu m.
”Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ, e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha, “Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe. Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ, Onye kwesiri ntụkwasị obi, Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.”
”Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.
”Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe ONYENWE ANYỊ ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya. Tienụ mkpu ọṅụ unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem, nʼihi na ONYENWE ANYỊ akasịela ndị ya obi. Ọ gbapụtala Jerusalem.
”Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.
”Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ.
”Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.
”Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị. Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa. Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.
”na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha. O zitere m inye ha okpueze mara mma nʼọnọdụ ntụ, inye ha ọṅụ, nʼọnọdụ ịkwa akwa, na iyikwasị ha mmụọ otuto nʼọnọdụ mmụọ ịda mba. Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha, dịka osisi ook siri ike, igosi ịma mma ONYENWE ANYỊ.
”Olee onye ahụ ike ya mere ka osimiri kewaa abụọ nʼihu ha, mgbe Mosis weliri aka ya elu, meekwa ka aha ya dịgide ruo ebighị ebi?
”Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.
”Ma otu ọbụla o si dị, gị ONYENWE ANYỊ bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
”Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m? Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”
”“Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka ONYENWE ANYỊ kwuru.
”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, na-ajụ sị, o kwesighị ka unu tụọ m egwu?” “O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m? Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere. Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe. Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya. Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
”Ma naanị ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
”Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ! Nyenụ ONYENWE ANYỊ otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume.
”“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.
”“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
”Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
”“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime. Ị na-egosi ịhụnanya nye ọtụtụ puku ndị mmadụ ma na-eweta ịta ahụhụ nye ụmụ site nʼihi mmehie nna ha. O Chineke dị ukwuu dịkwa ike, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha gị.
”“Abụ m ONYENWE ANYỊ, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime?
”olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ ONYENWE ANYỊ, ndị ahụ ga-asị, “ ‘ “Nyenụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na ONYENWE ANYỊ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru.
”Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.
”Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
”Gị, ONYENWE ANYỊ, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
”Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha. Mgbe ahụ ha kwụsịrị mechie nku ha olu sitere nʼime ihe ahụ dịka mbara eluigwe nke dị nʼelu isi ha na-abịa. Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya, ahụ onye ahụ na-egbu maramara dịka ọkụ. Site nʼụkwụ ya ruo nʼukwu ya, ọ dị ka ọkụ na-enwu enwu, ìhè nke na-enwukwa ka ọkụ gbara ya gburugburu. Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo. Otu a ka ebube ONYENWE ANYỊ si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.
”Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke ONYENWE ANYỊ sị nʼọnọdụ ya bilie.
”Ebiliri m gaa nʼebe ahụ ala dị larịị. Ebube Onyenwe anyị guzo nʼebe ahụ dịka ebube nke m hụrụ nʼakụkụ iyi Keba. Adara m kpuo ihu m nʼala.
”Ma, lee, ebube Chineke Izrel jupụtara nʼebe ahụ, dị ka m si hụ ya na mbụ na ndagwurugwu.
”Mgbe ahụ, ebube ONYENWE ANYỊ sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube ONYENWE ANYỊ jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ. Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi.
”Emesịa, ebube nke ONYENWE ANYỊ sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ. Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ ONYENWE ANYỊ, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha.
”Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha. Ebube ONYENWE ANYỊ sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
”Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’
”Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile. Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja. Ebube ONYENWE ANYỊ sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ. Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m. Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe nke ocheeze, na ebe nke ọbụ ụkwụ m abụọ ga-anọgide, ebe a ka m ga-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọ Izrel agaghị emerụkwa aha nsọ m ọzọ, ha onwe ha maọbụ ndị eze ha, site nʼikpere arụsị niile ha na ibubata onyinye olili ozu ndị eze ha, mgbe ha nwụrụ anwụ.
”Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼụlọnsọ nke ONYENWE ANYỊ. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
”Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe, Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya. Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya. Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha, nʼihi na i nyela m amamihe na ike. I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị, i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.”
”“Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi.
”Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
”Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.
”“Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.
”“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.
”Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’
”Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’
”Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke ONYENWE ANYỊ, na site nʼịdị ukwuu nke aha ONYENWE ANYỊ Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.
”Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
”Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube ONYENWE ANYỊ, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
”Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa. Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.
”Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
”Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
”Ma mụ onwe m ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ nke ga-agba ya gburugburu.’ Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. ‘Aga m aghọ ebube nʼetiti ya.’
”Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke ONYENWE ANYỊ nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
”Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYỊ. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’
”Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn! Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem! Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị, onye ezi omume na onye nwere mmeri, onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.
”Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda.
”Ma ONYENWE ANYỊ ga-abụ eze nʼelu ụwa niile. Nʼụbọchị ahụ, naanị otu ONYENWE ANYỊ ga-adị, naanị aha ya kwa ka a ga na-efe ofufe.
”Mgbe ahụ, ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ gwarịtara ibe ha okwu, ONYENWE ANYỊ ṅara ntị, nụkwa ihe ha na-ekwu. Nʼihu ya, e nwere akwụkwọ ncheta dị ya, ebe e dere aha ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ, ma na-echekwa echiche banyere aha ya.
”“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
”na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.”
”Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá.
”Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi. Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”
”Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.
”“Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe.
”Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa, kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’
”O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”
”Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọnsọ ukwu nọ nʼebe a.
”Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.”
”Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel.
”Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
”Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè.
”Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ olu a, ha dara nʼala nʼihi egwu.
”Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.”
”Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.
”“Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ”
”Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
”Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’?”
”Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’ Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile.
”“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.
”“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
”Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
”Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
”Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
”Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu.
”Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya.
”Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.
”Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”
”Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”
”Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.”
”Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.”
”Ndị na-aga nʼihu na ndị na-esokwa nʼazụ, tiri mkpu na-asị, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
”Jisọs zara ya sị, “Nke kachasị mkpa bụ nke a, ‘Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. Were obi gị niile na mkpụrụobi gị niile na uche gị niile na ike gị niile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya.’
”“Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube.
”Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.
”Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
”Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
”Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
”Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu.
”Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke.
”Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.
”Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.”
”Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
”Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ.
”Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
”Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị, “Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe. Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.”
”Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.
”Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ”
”Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.”
”Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”
”Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.
”Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,
”Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.
”Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”
”Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa.
”Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
”Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”
”Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.
”Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ, na-asị, “Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.” Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!” Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.”
”Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii.
”Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
”Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.” Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.”
”Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.”
”Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu.
”Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.”
”Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.
”E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.
”Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.
”Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
”Ọ ghaghị ịdị elu, ma mụ onwe m aghaghị ịdịkwa ala. “Onye ahụ si nʼelu bịa dị elu karịa ihe niile, onye ahụ si nʼụwa bụkwa nke ụwa ma na-ekwukwa okwu dị ka onye si nʼụwa. Onye ahụ si nʼeluigwe dị elu karịa ihe niile.
”Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem. Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu. Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya. Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
”Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.
”Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
”Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.”
”Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.
”Mụ na nna m bụ otu.”
”Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?”
”Nʼechi ya oke igwe mmadụ ahụ ndị bịara mmemme nụrụ na Jisọs na-abịa Jerusalem. Ha weere igu nkwụ pụọ izute ya na-eti mkpu, “Hozanna!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Ngọzị dịrị eze Izrel!” Jisọs hụrụ nwa ịnyịnya ibu, nọkwasị nʼelu ya, dị ka e dere ya, “Atụla egwu, gị ada Zayọn! Lee, eze gị ka ọ na-abịa. Ọ nọkwasịrị nʼelu nwa ịnyịnya ibu.”
”Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto.
”Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”
”Mgbe ọ pụrụ, Jisọs sịrị, “Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya. Ọ bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ọ ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa.
”Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya.
”Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.
”Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ. Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa.
”Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.) Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala.
”Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?”
”Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.” Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.”
”Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?”
”O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu. Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin. Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.” Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.”
”Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!”
”Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.
”“Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
”Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
”Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie.
”“Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.
”Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke. Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.”
”Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile.
”Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara.
”“Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo.
”Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị.
”Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ.
”Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.
”Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta. “Onye maara uche Onyenwe anyị? Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?”
”Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.
”Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.
”E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ”
”Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto. Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto. Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie. Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.” O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.” Ọzọkwa, “Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”
”Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen.
”E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
”Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ.
”Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
”Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”
”Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.
”Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst.
”Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya.
”Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya. Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ. Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.
”Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ, ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ. Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị. Nke ọ rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka ọ nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe. Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa. O mere ka ihe niile dị nʼokpuru ya, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe niile nye nzukọ ya bụ chọọchị. Nke bụ ahụ ya, ozuzu oke nke onye ahụ na-emejupụta ihe niile nʼụzọ niile.
”Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị, onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha. Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu; ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya. Ana m arịọkwa, ka unu na ndị nsọ niile nwee ike ịghọta ihe bụ obosara, ogologo, ịdị elu na ịdị omimi, na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke. Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị, ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen.
”Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.
”Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.)
”werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ. Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
”Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.
”Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.
”Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ.
”Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke. Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu. Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile. Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi. Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe.
”Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ.
”Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ. Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị.
”Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke. Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa. Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst. Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.
”Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu. Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.
”Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
”Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
”Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst.
”Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.
”Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.” O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.” Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ.
”Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.
”Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”
”Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike. Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya. Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.
”Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe.
”Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.
”o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi.
”Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke.
”Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs,
”Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
”Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata. Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.
”Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
”Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.
”Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto.
”onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.
”Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ.
”Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi. Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya. Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”
”Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
”sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie. O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. “Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.” Otu a ka ọ ga-adị! Amen.
”Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
”Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ. Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya. Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike. Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị. O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ. Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ.
”Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya. Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu. Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha.
”Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke. Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal. Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ.
”Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’ bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.” Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”
”Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.” Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile. Ọ gara nʼihu were akwụkwọ ahụ site nʼaka nri onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ. Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ. Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile. Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”
”Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ. Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị, “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.” Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ ruo mgbe niile ebighị ebi!” Anụ anọ ahụ dị ndụ zakwara sị, “Amen!” Ndị okenye ahụ dakwara nʼala nʼihu ya kpọọ isiala nye ya.
”Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe, na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.”
”Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.
”Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke, na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-adị, na onye dịkwaarị, nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị malitekwa ịchị ọchịchị.
”Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke.
”Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ. Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta. Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ. Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
”O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
”Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya.
”Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ. “Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị, Eze nke mba niile. Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”
”Mgbe ahụ ụlọnsọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ si nʼebube na ike Chineke na-apụta. O nweghị onye ọbụla nwere ike ịba nʼụlọnsọ ahụ tutu ruo mgbe ntaramahụhụ asaa nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụchara.
”Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
”Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.
”Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!” Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.” Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị. Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ. Ka anyị nye ya otuto. Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola, nwunye ya edoziekwala onwe ya.
”Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.
”Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya: Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.
”Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha. Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.
”Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya. Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
”O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere. Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ.
”Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta, nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile. A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe. Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha.
”Abụ m Alfa na Omega. Onye mbụ na Onye ikpeazụ, Mmalite na Ọgwụgwụ.
”