12 – Mmekọahụ rụrụ arụ

Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Mmekọahụ rụrụ arụ.

Top 3 Kasị Mkpa Amaokwu

Matiu 5:28

Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.

Ndị Galeshịa 5:24

Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.

Matiu 19:9

Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”

Amaokwu ọ bụla n'usoro Canonical – 177 amaokwu

Jenesis 2:24

Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.

Jenesis 18:20-32

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke. Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.” Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume? Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya? Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.” Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ. Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” ONYENWE ANYỊ zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.” Mgbe ahụ ọ sịrị, “Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?” ONYENWE ANYỊ zaghachiri sị ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya.” O kwuru sị, “Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?” ONYENWE ANYỊ zara sị, “Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya.” Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, “Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?” ONYENWE ANYỊ zara sị, “Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya.”

Jenesis 19:1-11

Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala. Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.” Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya. Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ. Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.” Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya, sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.” Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya. Ma ndị ikom ahụ nọ nʼụlọ Lọt, setịpụrụ aka ha dọbata ya nʼụlọ, ma mechie ụzọ ahụ. Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ.

Jenesis 19:12-17

Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha! Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru ONYENWE ANYỊ ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.” Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu. Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.” Mgbe Lọt ka nọ na-eche ihe ọ ga-eme, ndị ikom ahụ jidere ya nʼaka, jidekwa nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ duru ha pụọ nʼobodo ahụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ nwere obi ebere nʼebe ha nọ. Mgbe ha si nʼime obodo kpọpụta ha, otu onye nʼime ha gwara ha sị, “Gbalaganụ nʼihi ndụ unu. Unu elekwala anya nʼazụ. Unu akwụsịkwala ebe ọbụla na mbara ala. Gbaganụ nʼugwu, nʼihi na ọ bụrụ na unu emeghị otu a, a ga-ekpochapụ unu.”

Jenesis 19:24

Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke ONYENWE ANYỊ mere ka o si nʼeluigwe zoo.

Jenesis 19:26

Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu.

Jenesis 20:3

Ma Chineke bịakwutere Abimelek na nrọ nʼanyasị, sị ya, “Onye nwụrụ anwụ ka ị bụ, nʼihi nwanyị nke ị kpọọrọ, nwanyị a bụ onye nwere di.”

Jenesis 34:2

Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa.

Jenesis 34:7

Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme.

Jenesis 34:26-27

Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha. Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.

Jenesis 34:31

Ma ha zara sị ya, “O kwesiri ka o meso nwanne anyị nwanyị mmeso dịka ọ bụ akwụna?”

Jenesis 38:15-26

Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya. Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?” Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?” Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime. Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya. Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya. Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.” Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ” Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.” Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.” Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.” Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.

Jenesis 39:7-12

Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.” Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya. O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.” Ọ bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya. Otu ụbọchị, Josef batara nʼime ụlọ ịrụ ọrụ ya. O nweghị ndị ọzọ na-eje ozi nọ nʼime ụlọ nʼụbọchị ahụ. Nwunye Pọtifa jidere Josef nʼuwe mwụda ya, rịọọ ya sị ya, “Bịa ka anyị dinaa.” Ma Josef si nʼime ụlọ ahụ gbapụ, hapụ uwe mwụda ya nʼaka nwunye Pọtifa.

Jenesis 39:13-20

Mgbe nwanyị a hụrụ na Josef agbapụla, hapụ uwe ya, ọ kpọrọ ndị na-eje ozi nʼezinaụlọ ya sị ha, “Lee, onye Hibru a di m kpọbatara nʼụlọ a chọrọ iji anyị gwurie egwu. Ọ bịakwutere m nʼime ụlọ chọọ ka mụ na ya dinaa. E tiri m mkpu nʼolu ike. Mgbe ọ nụrụ ka m welitere olu m tie mkpu enyemaka m tiri, o sitere nʼime ụlọ a gbapụ, ma hapụrụ m uwe ya.” Nwanyị a debere uwe ahụ nʼakụkụ ya ruo mgbe nna ya ukwu lọtara nʼụlọ. Mgbe ahụ, ọ gwara di ya okwu ndị a sị, “Onye ohu Hibru a ị kpọbataara anyị bakwutere m iji m gwurie egwu. Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.” Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ. Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,

Ọpụpụ 20:14

Gị akwala iko.

Ọpụpụ 20:17

Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”

Ọpụpụ 22:19

“Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ.

Levitikọs 18:6-18

“ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. “ ‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ. “ ‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke. “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ. “ ‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ.

Levitikọs 18:19-23

“ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka. “ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a. “ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. “ ‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ. “ ‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.

Levitikọs 19:29

“ ‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.

Levitikọs 20:10-16

“ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu. “ ‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere. “ ‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ. “ ‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.

Levitikọs 20:17-21

“ ‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi. “ ‘Nwoke ọbụla nke ya na nwanyị nọ na nsọ nwanyị ya dinakọrọ nwee mmekọ ekpugheela adịghị ọcha nwanyị ahụ. Nwanyị ahụ nʼonwe ya ekpugheekwala adịghị ọcha nke ya. A ga-ebipụ ha abụọ site nʼetiti ndị ha. “ ‘Ị gaghị enwe mmekọ edina nʼetiti gị na nwanne nwanyị nne gị maọbụ nwanne nwanyị nna gị, nʼihi na nke a bụ ihe nleda anya nye onye ọbara jịkọrọ gị na ya. Ikpe ọmụma ga-adịrị unu abụọ. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.

Levitikọs 21:7-9

“ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ. “ ‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ.

Levitikọs 21:14

Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya,

Ọnụọgụgụ 5:12-13

“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, Ọ bụrụ na nwunye mmadụ ejehie ụzọ bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe di ya nọ site nʼidinakwuru nwoke ọzọ nʼụzọ zoro ezo nʼebe di ya nọ ruo na achọpụtaghị adịghị ọcha ya (ebe a na-enweghị onye ga-agba akaebe megide ya, maọbụ na e jidere ya mgbe ọ na-akwa iko ahụ),

Ọnụọgụgụ 5:29

“ ‘Nke a bụ iwu metụtara ikwo ekworo mgbe nwanyị bi nʼụlọ di ya kpafuru merụọ onwe ya.

Ọnụọgụgụ 25:6

Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

Diuteronomi 5:18

Gị akwala iko.

Diuteronomi 5:21

Gị enwela anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala agụụ inwetara onwe gị ụlọ onye agbataobi gị, maọbụ nʼebe ala ya, maọbụ ohu ya nwoke, maọbụ ohu ya nwanyị, maọbụ ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi nwere dị.”

Diuteronomi 22:5

Nwanyị ekwesighị iyi uwe ndị ikom, nwoke agaghị eyikwa uwe ndị inyom. Nʼihi na ihe arụ ka ọ bụ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị.

Diuteronomi 22:20-21

Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke. A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.

Diuteronomi 22:22

Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.

Diuteronomi 22:23-24

Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo, ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.

Diuteronomi 22:25-27

Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ. Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya. A pụrụ ị sị na nwaagbọghọ ahụ tiri mkpu ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.

Diuteronomi 22:28-29

Ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri ike jide nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-ekwebeghị nkwa ịlụ, mee ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ iri shekel ọlaọcha ise. Ọ ga-alụkwa nwaagbọghọ ahụ nʼihi na o mebiela ya. Ọ gakwaghị achụpụ ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

Diuteronomi 22:30

Nwoke ọbụla agaghị alụ nwunye nna ya, nʼihi na ọ bụ nwunye nna ya. Ime ihe dị otu a bụ imerụ ihe ndina nna ya.

Diuteronomi 23:2

Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYỊ, ụmụ ụmụ ya, ruo nʼọgbọ nke iri, agakwaghị esonye na mkpọkọta ONYENWE ANYỊ.

Diuteronomi 23:17-18

Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị. Ị gaghị ewebata nʼụlọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke gị.

Diuteronomi 27:20

“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Diuteronomi 27:21

“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Diuteronomi 27:22

“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Diuteronomi 27:23

“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

Ndị Ikpe 16:1

Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị.

Ndị Ikpe 19:1-2

Nʼoge a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼoge ahụ kwa, ọ dị otu nwoke, onye Livayị bi nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Nwoke a gara Betlehem, nʼime Juda, kpọrọ otu nwaagbọghọ ka ọ bụrụ iko ya nwanyị. Ma iko ya nwanyị ahụ kwara iko megide ya. Ọ hapụrụ ya laghachi nʼezinaụlọ nne na nna ya na Betlehem, Juda. Ọ nọrọ ọnwa anọ nʼebe ahụ.

Ndị Ikpe 19:22-30

Ma mgbe ha risiri nri, nọrọ na-ezu ike, na-akpakọrịta ụka, na mberede, ndị ikom ụfọdụ sitere nʼobodo ahụ, ndị jọgburu onwe ha nʼomume gbara ụlọ ahụ gburugburu. Ha malitekwara iti aka nʼụzọ ahụ na iti mkpu na-akpọku agadi nwoke ahụ, sị ya, “Kpọpụta onye ọbịa ahụ nọ nʼime ụlọ gị ka anyị mara ya.” Agadi nwoke ahụ bụ onyenwe ụlọ ahụ pụkwuuru ha nʼezi, sị ha, “Biko ụmụnna m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Nwoke a nọ nʼụlọ m dịka ọbịa. Unu emela ihe ihere dị otu a. Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.” Ma ndị ikom ahụ egeghị ya ntị. Ya mere, nwoke ahụ kpọpụtara iko ya nwanyị zipụrụ ha ya nʼezi. Ha niile nʼotu na otu, dinakwuru nwanyị ahụ abalị ahụ niile. Mgbe chi na-achọ ịbọ, ha hapụrụ ya ka ọ laa. Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie. Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ. Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya. Mgbe ọ bịaruru obodo ya, ọ banyere nʼụlọ ya wepụta mma jiri ya bọwaa ozu iko ya nwanyị ahụ ụzọ iri na abụọ. O zigaara ebo iri na abụọ niile dị nʼIzrel otu ụzọ, otu ụzọ. Nʼihi nke a, Onye ọbụla hụrụ ihe ọjọọ a kwuru sị, “O nwebeghị onye ọbụla mere ụdị ajọ omume dị otu a kemgbe ụmụ Izrel si nʼobodo Ijipt pụta. Chee echiche banyere ihe a. Tulee ya ma gwa anyị ihe anyị ga-eme?”

Ndị Ikpe 20:10-11

Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.” Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ.

1 Samuel 2:22

Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute.

2 Samuel 11:2-5

Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya. Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het. Devid ziri ka a gaa kpọta ya. Mgbe ọ bịara, ya na Devid dinara. (Ka ọ ghụchasịrị onwe ya site nʼadịghị ọcha ya nke ọnwa ahụ.) Ọ laghachiri nʼụlọ ya. Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.”

2 Samuel 12:9-12

Gịnị mere i ji lelịa okwu ONYENWE ANYỊ anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya. Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’ “Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile. I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”

2 Samuel 13:11-14

Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.” Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a. Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.” Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.

1 Ndị Eze 11:1-6

Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het. Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya. Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya. Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo ONYENWE ANYỊ Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere. Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn. Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. O soghị ụzọ ONYENWE ANYỊ dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.

1 Ndị Eze 14:24

E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ.

1 Ndị Eze 15:12

O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere.

1 Ndị Eze 22:46

O kpochapụrụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị, bụ ndị nke fọdụrụ, mgbe nna ya bụ Asa chịchara ọchịchị.

2 Ndị Eze 23:7

Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.

Job 31:1

“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.

Ilu 2:16-17

Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu. Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.

Ilu 5:3-4

Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ, okwu ọnụ ya na-akwọ mụrụmụrụ karịa mmanụ. Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu dịkwa nkọ ka mma agha ihu abụọ.

Ilu 5:20

Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?

Ilu 6:24-29

idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi. Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ? Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ? Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.

Ilu 6:32

Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.

Ilu 7:5-10

Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya. Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya, hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ, ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme, nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi. Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.

Ilu 7:21-27

Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ. O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya, nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya. Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu. Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị. Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya. Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.

Ilu 11:6

Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.

Ilu 22:14

Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe ONYENWE ANYỊ na-adaba nʼime ya.

Ilu 23:27-28

Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara. Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.

Ilu 29:3

Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.

Ilu 30:20

“Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’

Ekiliziastis 7:26

Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ, ihe ahụ bụ nwanyị. Obi ya dị ka ụgbụ. Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe. Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ, ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.

Aịzaya 1:21

Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.

Aịzaya 57:3

“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị, unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.

Jeremaya 3:1-3

“Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m, nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ, di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ? Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu? Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko, ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?” otu ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a. Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.

Jeremaya 3:6-8

Ozi a, nke si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ. Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya. Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko.

Jeremaya 3:20

Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi, i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.

Jeremaya 5:7-8

“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ. Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.

Jeremaya 7:9

“ ‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị?

Jeremaya 13:27

Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị, na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile! Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile, nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa. Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem! Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”

Jeremaya 23:14

Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. Ha na-agba ndị ajọ omume ume, si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”

Jeremaya 29:23

Nʼihi na ha emeela ihe ndị jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel; ha na nwunye ndị agbataobi ha akwaala iko; ha esitekwala nʼaha m buo amụma ụgha, amụma nke m na-enyeghị ha iwu ibu. Amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu, nʼihi na ahụrụ m ya.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.

Abụ Akwa 5:11

Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.

Izikiel 16:15-17

“ ‘Ma ị tụkwasịrị mma gị obi, jiri nʼihi na a mara aha gị ghọọ onye akwụna. I wekwaara onwe gị nye nwoke ọbụla gabigara mee ka mma gị bụrụ nke ya. Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla. Ị chịrị ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ mara mma, bụ nke m nyere gị, were ha kpụọrọ onwe gị oyiyi nwoke dị iche iche, ndị ị na-akpọ isiala nye. Nʼụzọ dị otu a ka gị na ha si na-akwakọ iko.

Izikiel 16:20-22

“ ‘Ụmụ niile ị mụtaara m, nwoke na nwanyị, ka i ji chụọrọ arụsị gị aja ka ha rie. Ọ bụ na ịgba akwụna gị ezughịrị gị? Ma i gburu ụmụ m, jiri ha chụọ aja nye arụsị! Nʼoge ndị a niile ị na-akwa iko, na-eme ihe arụ ndị a niile, o metụbeghị gị nʼobi ka i cheta ụbọchị niile ndị ahụ ị bụ nwantakịrị, mgbe ị nọ na-agba ọtọ, mgbe ọbara jupụtara gị nʼahụ.

Izikiel 16:25-29

I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ, mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye. Ị kwasoro ndị Ijipt bụ ndị agbataobi gị iko, ndị anụahụ ha dị ukwuu. I si otu a mee ka iwe dị ukwuu wee m megide ịkwa iko gị nke na-aba ụba. Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi. Gị na ndị Asịrịa akwaala iko, nʼihi na afọ adịghị eju gị. Ọ bụladị mgbe nke a gasịrị, ị bụkwa onwe na-enweghị afọ ojuju. I mere ka ịkwa iko gị mụbaa ruo ala ndị Kaldịa, mba ahụ ịzụ ahịa doro anya. Ma ọbụladị na nke a afọ ejughịkwa gị.

Izikiel 16:30-34

“ ‘Iwe m dị ọkụ megide gị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. Mgbe ị na-eme ihe ndị a, ị na-eme ha nnọọ dị ka onye akwụna nke ihere adịghị eme. Mgbe ị rụrụ ụlọ arụsị nʼisi ụzọ niile, wuokwa ụlọ ịkwa iko gị na mbara ụzọ niile, i meghị ya dịka akwụna, nʼihi na ị jụrụ ịnara ndị gị na ha kwara iko ego ọbụla. “ ‘Nʼezie, ị bụ nwanyị na-akwa iko ma ị nọ na di, onye na-anabata ndị ikom ọzọ karịa di ya! Ndị akwụna niile na-anata onyinye, ma gị onwe gị na-enye ndị ikom niile hụrụ gị nʼanya onyinye, inye ha ngarị ka ha bịakwute gị site nʼebe niile bịakwute gị nʼihi ịgba akwụna gị. Nʼihi ya, ị dị iche nʼetiti ndị inyom ndị ọzọ nʼụdị ịgba akwụna gị, o nweghị onye na-agbaso gị na-arịọ gị maka ịkwaso gị iko. Ị kwụrụ ụgwọ ma o nweghị ụgwọ a kwụrụ gị, nʼụzọ dị otu a ị dị iche.

Izikiel 16:35-38

“ ‘Nʼihi nke a, gị nwanyị akwụna, nụrụ okwu ONYENWE ANYỊ! Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị, nʼihi ya, aga m achịkọta ndị niile bụ ndị ahụ niile ị hụrụ nʼanya, ndị gị na ha na-enwe obi ụtọ, ndị ị hụrụ nʼanya, ma ndị ị kpọrọ asị. Aga m achịkọta ha site gburugburu gị imegide gị, gbaa gị ọtọ nʼihu ha, ka ha hụ ọtọ gị niile. Aga m ata gị ahụhụ a na-ata ndị inyom na-akwa iko, na ndị inyom na-egbu mmadụ. Aga m eme ka ịbọ ọbọ ọbara nke ọnụma m, ya na ekworo m, bịakwasị gị.

Izikiel 16:41-43

Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị. Mgbe ahụ, oke iwe m megide gị ga-adajụ, ekworo m ga-esite nʼebe ị nọ gabiga. Aga m anọ nwayọọ gharakwa iwe iwe ọzọ. “ ‘Ebe ọ bụ na ị chetaghị ụbọchị ndị ahụ niile, mgbe ị dị nʼagbọghọbịa, ma i ji ihe ọjọọ ndị a niile ị na-eme kpasuo m iwe. Ya mere, aghaghị m ịkwụghachi gị dịka mmehie gị si dị. Ọ bụ na i meghị omume ndị a rụrụ arụ, tinyekwara mmehie agụụ ịkwa iko? Ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.

Izikiel 22:9-11

Ndị nkwutọ, ndị na-awụsi ọbara nọ nʼime gị. Ndị na-eri nri nʼihu arụsị niile dị nʼelu ugwu, na ndị na-eme omume rụrụ arụ nọkwa nʼime gị. Nʼime gị ka ndị na-akwaso nwunye nna ha iko dị, nʼime gị ka ndị na-awakpo ụmụ nwanyị mgbe ha nọ na nsọ ha, bụ mgbe ha nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha. Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ.

Izikiel 23:1-21

Okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị m, “Nwa nke mmadụ, ọ dị ndị inyom abụọ nke otu nne mụrụ. Ha ghọrọ ndị akwụna nʼala Ijipt site na mgbe ha bụ agbọghọ. Nʼala ahụ, a bịagidere ara ha aka, pịakwa ọnụ ara agbọghọ ha aka nʼọnọdụ igwuri egwu. Aha nke okenye bụ Ohola. Aha nwanne ya nwanyị bụ Oholiba. Ha bụrịị nkem, ha mụtakwara m ụmụ ndị nwoke na ndị nwanyị. Ohola bụ Sameria, Oholiba bụkwa Jerusalem. “Ohola na-agba akwụna mgbe ọ ka bụ nkem. O nwere agụụ ịkwa iko nʼebe ndị niile ọ hụrụ nʼanya nọ, bụ ndị dike nʼagha nke ndị Asịrịa, ndị yi uwe anụnụ, ndịisi ọchịchị na ndị ọchịagha, ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma nʼile anya, na ndịisi agha, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya. O weere onwe ya nyefee nʼaka ndị ikom Asịrịa ogugo ha kachasị elu dịka onye akwụna, merụọkwa onwe ya site nʼife arụsị dị iche iche nke onye ọbụla agụụ ya gụrụ obi ya. Ma ọ hapụghị mmụọ akwụna ahụ dị nʼime ya, bụ nke o bidoro nʼIjipt, nke bụ na mgbe ọ bụ agbọghọ ya na ndị ikom dinakọrọ, ha na-apịkwa ọnụ ara agbọghọ ya aka, na-awụkwasịkwa agụụ nke ọchịchọ ọjọọ ha nʼahụ ya. “Nʼihi nke a enyefere m ya nʼaka ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, bụ ndị Asịrịa, ndị agụụ ha na-agụ ya. Ha gbara ya ọtọ, ha kpọọrọ ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, ma ya onwe ya ka ha were mma agha gbuo. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọrọ ihe akụkọ ilu nʼetiti ndị inyom niile, a takwara ya ahụhụ. “Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị. Ya onwe ya kwa, agụụ ụmụ Asịrịa gụrụ ya, bụ ndịisi ọchịchị, na ndị ọchịagha, ndị dike nʼagha yi uwe agha dịka o kwesiri, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya, ha niile bụ ụmụ okorobịa dị mma nʼile anya. Ahụrụ m na ya onwe ya merụkwara onwe ya; ha abụọ si otu ụzọ aga. “O gara nʼihu tụkwasị ihe nʼịgba akwụna ya karịa. Ọ hụrụ onyinyo ndị ikom atụnyere nʼahụ aja, bụ onyinyo nke ndị Kaldịa e ji ihe chara uhie uhie sepụta, ha kere ihe okike nʼukwu ha nakwa akwa okike nʼisi ha; nʼile anya ha niile dịka ndịisi ụgbọ agha ndị Babilọn, Kaldịa bụ ala amụrụ ha. Ngwangwa ọ na-ele ha anya, agụ ha gụrụ ya, o zipụrụ ha ndị ozi na Kaldịa. Mgbe ahụ ndị Babilọn bịakwutere ya, nʼelu ihe ndina ịhụnanya, nʼime agụụ nke anụ ahụ ha, ha merụrụ ya. Mgbe ha mesịrị ka ọ bụrụ ihe rụrụ arụ site nʼịkwa iko, o si nʼebe ha nọ wezuga onwe ya nʼọnọdụ ịsọ ha oyi. Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ. Ma ọ gara nʼihu na-akwa iko karịa, dịka ọ na-echeta ndụ akwụna o biri nʼIjipt mgbe ọ bụ agbọghọ. Nʼebe ahụ, agụụ ndị ikom ya na ha na-akwa iko gụrụ ya, bụ ndị anụahụ ha dịka nke ịnyịnya ibu, ndị ihe ha na-anyụpụta dịkwa ka nke ịnyịnya. Ya bụ, na-agụụ ndụ ọjọọ nke i biri mgbe ị bụ agbọghọ na-agụsị gị ike, mgbe ị nọ nʼIjipt ebe a na-abịagide gị aka nʼara, ebe apịkwara ọnụ ara nta gị aka.

Izikiel 23:27-30

Nʼụzọ dị otu a, a ga-eme ka agụ ọchịchọ ọjọọ nke anụahụ na ịkwa iko, bụ nke i bidoro nʼala Ijipt kwụsị. Ị gaghị enwekwa agụụ ile ihe ndị a niile anya maọbụ chetakwa Ijipt nʼuche gị. “Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Lee, ana m aga iwere gị nyefee nʼaka ndị ahụ kpọrọ gị asị, bụ ndị ahụ ị wezugara onwe gị site nʼebe ha nọ nʼihi ịsọ oyi. Ha ga-esite nʼịkpọ asị mesie gị ike, pụnara gị ihe niile i nwere nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ha. Ha ga-ahapụ gị ka ịgbara ọtọ ihu na azụ, mgbe ahụ ihere nke ịgba akwụna gị ga-apụta ihe. Agụụ nke ọchịchọ ọjọọ na ịkwa iko gị emeela ka ihe ndị a bịakwasị gị, nʼihi na agụụ mmekọrịta nʼebe mba ndị ọzọ gụrụ gị, ị jikwa arụsị ha merụọ onwe gị.

Izikiel 23:35-39

“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ebe ọ bụ na i chefuola m, gbakụta m azụ gị, ị ga-ata ahụhụ niile ruuru gị nʼihi mmehie, agụụ ọchịchọ ọjọọ na ịgba akwụna gị.” ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme. Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha. Ihe ọzọ ha mere m bụ nke a: Ha merụrụ ebe nsọ m nʼotu ụbọchị ahụ ha mere ka ụbọchị izuike m gharakwa ịdị nsọ. Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m.

Izikiel 23:40-45

“Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị. Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya. “Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi. Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’ Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba. Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha.

Izikiel 23:48-49

“Otu a, aga m eme ka ibi ndụ ọjọọ kwụsị nʼala ahụ, ka esi otu a adọ ndị inyom niile aka na ntị, ka ha hapụ ịgbaso nzọ ụkwụ gị. Ị ghaghị ịta ahụhụ nʼihi ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị, hụkwaa ahụhụ nʼihi mmehie niile nke ịkpọ isiala nye arụsị. Mgbe ahụ ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ.”

Hosiya 1:2

Na mmalite okwu ONYENWE ANYỊ site nʼọnụ Hosiya, ONYENWE ANYỊ gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ ONYENWE ANYỊ.”

Hosiya 2:2-5

“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ. Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ. Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko. Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’

Hosiya 4:2

Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.

Hosiya 4:12-14

Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha. Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko. “Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.

Hosiya 5:3-4

Amaara m ihe niile gbasara Ifrem, ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ. Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna; gị Izrel, emerụọkwala gị. “Omume ha agaghị ekwe ka ha laghachikwute Chineke ha, nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha, ha amaghịkwa ONYENWE ANYỊ.

Hosiya 9:1

Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel, ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ, nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya nʼelu ebe ịzọcha ọka niile.

Juel 3:3

Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ.

Nehum 3:4

Ihe ndị a mere nʼihi enweghị afọ ojuju nke agụụ nke onye na-akwa iko, onye ji mma ile anya, nwanyị nwe mgbaasị dị iche iche, onye ji mba dị iche iche nʼagbụ site nʼịgba akwụna ya, na ọtụtụ mmadụ dị iche iche site na mgbaasị ya.

Malakaị 2:14-16

Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị. Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ. “Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka ONYENWE ANYỊ Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ ONYENWE Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.

Malakaị 3:5

“Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Matiu 5:27-28

“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’ Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.

Matiu 5:32

Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

Matiu 15:19

Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu.

Matiu 19:9

Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”

Matiu 26:41

Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.”

Mak 7:21-23

Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ, ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, ọchịchọ ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, ekworo, aghụghọ niile, adịghị ọcha niile, inwe anya ụfụ nʼebe ndị ọzọ nọ, nkwulu niile, nganga na enweghị uche ọbụla. Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”

Mak 10:11-12

Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya. Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”

Mak 10:19

Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’”

Luk 16:18

“Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụlakwa lụrụ nwanyị di ya jụrụ na-eme mmehie ịkwa iko.

Luk 18:20

Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.”

Jọn 8:3-11

Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?” Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.” Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?” Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”

Ọrụ Ndị Ozi 15:20

kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara.

Ọrụ Ndị Ozi 15:29

Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.

Ọrụ Ndị Ozi 21:25

Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”

Ndị Rom 1:24-27

Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha. Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi. Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.

Ndị Rom 1:28-29

Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara. Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ,

Ndị Rom 1:32

Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.

Ndị Rom 6:12-13

Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi. Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.

Ndị Rom 6:19

Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.

Ndị Rom 7:3-5

A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ. Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke. Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.

Ndị Rom 7:23

Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.

Ndị Rom 8:1-8

Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst. Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ. Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ. Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị. Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ. Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo. Nʼihi na onye ọbụla tụkwasịrị uche ya nʼihe nke anụ ahụ na-ebuso Chineke agha, ọ naghị edebe iwu nke Chineke. Nʼeziokwu, ọ gaghị enwe ike idebe ya. Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.

Ndị Rom 8:12-13

Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ ma ọ bụghị anụ ahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.

Ndị Rom 12:1

Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.

Ndị Rom 13:9

Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.”

Ndị Rom 13:13-14

Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo. Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.

1 Ndị Kọrint 5:1

Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri.

1 Ndị Kọrint 5:9-13

E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla. Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ. Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri. Kedụ nke gbasara m ikpe ndị na-esoghị na chọọchị ikpe? Ọ bụghị ndị nọ nʼime ka unu ga-ekpe ikpe. Chineke ga-ekpe ndị nọ nʼezi ikpe. “Chụpụnụ onye ajọọ mmadụ ahụ site nʼetiti unu.”

1 Ndị Kọrint 6:9-11

Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke. Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume.

1 Ndị Kọrint 6:13

Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.

1 Ndị Kọrint 6:15-18

Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa! Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ. Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

1 Ndị Kọrint 7:1-5

Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.” Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya. Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya. Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

1 Ndị Kọrint 7:9

Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.

1 Ndị Kọrint 7:36

Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.

1 Ndị Kọrint 10:8

Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị.

1 Ndị Kọrint 10:12-13

Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda. O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.

2 Ndị Kọrint 5:10

Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.

2 Ndị Kọrint 7:1

Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.

2 Ndị Kọrint 12:21

Ana m atụ egwu na mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nʼihu unu, mee ka m kwa akwa nʼihi ụfọdụ nʼime unu ndị mehiere na mbụ, ma ha achọghị ichegharị site nʼihe ọjọọ ha mere, na nʼihi ọtụtụ nʼime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.

Ndị Galeshịa 5:16-21

Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ. Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime. Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu. Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko. Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu. Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.

Ndị Galeshịa 5:24

Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.

Ndị Galeshịa 6:7-8

Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka ọ na-aghọrọ. Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.

Ndị Efesọs 2:3

Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya.

Ndị Efesọs 4:19

Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu.

Ndị Efesọs 5:3-5

Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ. Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele. Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke.

Ndị Kọlọsị 3:5

Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).

1 Ndị Tesalonaịka 4:3-5

Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko, ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ. Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.

1 Ndị Tesalonaịka 4:7-8

Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ. Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.

1 Timoti 1:9-10

Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha, na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ,

2 Timoti 2:22

Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.

2 Timoti 3:2-6

Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya. Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ. Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ.

Taịtọs 2:12

Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a.

Ndị Hibru 12:16

Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri.

Ndị Hibru 13:4

Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.

Jemis 1:12-15

Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya. Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ. Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.

Jemis 4:3-4

Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa. Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.

1 Pita 1:14

Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu.

1 Pita 2:11

Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha.

1 Pita 4:1-3

Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie. Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama ọ na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke. Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ.

2 Pita 2:4-10

Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke; ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere (nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ). Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ. Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.

2 Pita 2:14

Anya ha jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, mmehie adịghị ejukwa ha afọ. Ha na-arafu ndị okwukwe ha na-esighị ike. Ha bụkwa ndị a maara aha ha nʼihi oke ọchịchọ. Nʼezie ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.

2 Pita 2:18

Ha na-eji okwu efu na-enweghị isi, na agụụ ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ ha, na-arafu ndị sitere nʼetiti ndị na-ebi ndụ ọjọọ na-ekewapụ onwe ha.

2 Pita 3:3

Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ

1 Jọn 2:16-17

Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa. Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Jud 1:4

Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.

Jud 1:6-8

Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.

Mkpughe 2:14

Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko.

Mkpughe 2:20-22

Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja. Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma ọ jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko. Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.

Mkpughe 9:21

Ha echegharịghị site nʼigbu mmadụ ha, maọbụ ụzọ mgbaasị ha, maọbụ ndụ ịkwa iko ha, na izu ohi ha pụta.

Mkpughe 14:8

Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”

Mkpughe 17:1-2

Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa. Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”

Mkpughe 18:3

Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”

Mkpughe 18:9

“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.

Mkpughe 19:2

Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.”

Mkpughe 21:8

Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”

Igbo - Ìgbò - IG

IGBCB'20 - Igbo Contemporary Bible - 2020

This Bible text is from Biblica Open Igbo Contemporary Bible 2020
https://open.bible/bibles/igbo-biblica-text-bible/
provided by: Biblica Inc, available by Creative Commons CC-BY-SA-4.0,
and this new compilation is shared as www.creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0.
Languages are made available to you by www.ipedge.net