30 – Ịchịkọta n'ikuku

Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Ịchịkọta n'ikuku.

Top 3 Kasị Mkpa Amaokwu

Matiu 24:29-31

“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’ “Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.

1 Ndị Tesalonaịka 4:16-17

Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

2 Ndị Tesalonaịka 2:1-4

Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola. Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.

Amaokwu ọ bụla n'usoro Canonical – 216 amaokwu

Jenesis 3:15

Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”

Job 19:25-27

Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ. Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke. Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!

Aịzaya 2:2-4

Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu ONYENWE ANYỊ, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu ONYENWE ANYỊ ga-esitekwa na Jerusalem pụta. Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.

Aịzaya 2:10-21

Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe ONYENWE ANYỊ, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya. Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị ONYENWE ANYỊ ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala), nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn, na osisi ook niile nke Bashan, nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu, nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike, nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma. Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị ONYENWE ANYỊ ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu ONYENWE ANYỊ, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ. Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ ONYENWE ANYỊ, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.

Aịzaya 4:4-5

Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha.

Aịzaya 9:6-7

Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.

Aịzaya 13:6-13

Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị ONYENWE ANYỊ dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu. Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri. Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha. Nʼihi na lee, ụbọchị ONYENWE ANYỊ na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere. Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa. Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.

Aịzaya 25:8

Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. ONYENWE ANYỊ ekwuola ya.

Aịzaya 34:2-10

Nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha. Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha. Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ. Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi. Mma agha ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼọbara, abụba kpuchikwara ya, ọbara ụmụ atụrụ na mkpi na abụba sitere nʼakụrụ ebule nʼihi na ONYENWE ANYỊ nwere ịchụ aja na Bozra. O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm. Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn. Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii. Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.

Aịzaya 45:22-23

“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị. Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.

Aịzaya 46:10

Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’

Aịzaya 52:8

Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe ONYENWE ANYỊ ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya.

Aịzaya 65:17

“Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.

Aịzaya 66:22

“Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.

Jeremaya 30:7

Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya.

Izikiel 34:11-13

“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ. Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma.

Izikiel 37:12-13

Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel. Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.

Daniel 2:28

Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a:

Daniel 2:31-35

“Eze, ihe ị hụrụ nʼọhụ bụ nke a. Ị hụrụ mmadụ a kpụrụ akpụ. Mmadụ a a kpụrụ akpụ buru nnọọ ibu. Ọ na-egbukwa nweghenweghe, bụrụkwa ihe na-eyi onye ọbụla lekwasịrị ya anya egwu. E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ isi mmadụ ahụ, jiri ọlaọcha kpụọ aka ya na obi ya. E jikwa bronz kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya. Ọ bụkwa igwe ka e ji kpụọ ogwe ụkwụ ya abụọ. Ma akụkụ ụkwụ ya, nke a na-azọ nʼala ka e ji igwe a gwara ya na ụrọ kpụọ. Mgbe ị na-ele anya, a wapụtara nkume, ma ọ bụghị aka mmadụ ka e ji wapụta ya. Nkume a kụrụ mmadụ ahụ a kpụrụ akpụ nʼukwu nkume na ụrọ ya, kụpịasịa ha. Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile.

Daniel 2:36-39

“Eze, nke a bụ nrọ ahụ. Ugbu a ka anyị kọwaara gị ihe nrọ ahụ pụtara. Gị onwe gị, eze, bụ eze nke ọtụtụ ndị eze ọzọ nọ nʼokpuru ya, onye Chineke nke eluigwe nyere ike ọchịchị, nʼocheeze niile, na ike na otuto; nyefeekwa nʼaka gị ụmụ mmadụ niile na ụmụ anụmanụ bi nʼime ọhịa, na ụmụ nnụnụ nke igwe, e mere ka ị bụrụ eze ihe niile ndị a, gị bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ. “Mgbe ị chịchara alaeze ọzọ ga-ebili, ma ọ gaghị adị ukwuu dịka nke gị, mgbe nke a gasịrị, alaeze ọzọ bụ nke atọ, nke ga-adị ka bronz ga-ebilikwa, ọ ga-achị ụwa niile.

Daniel 2:40-43

A ga-enwekwa alaeze nke anọ, nke ga-esi ike dịka igwe. Dịka igwe nke na-akụri ihe niile, ọ ga-egwepịa ma kụrikwaa ndị a niile. Ma ebe ị hụrụ na ọbụ ụkwụ ahụ na mkpịsịụkwụ ya niile na ụfọdụ nʼime ha bụ ụrọ ọkpụ ite na ụfọdụ bụkwa igwe, alaeze nke ekewara ekewa ka ọ ga-abụ, ma ọ ga-esitụ ike dịka igwe nke dị nʼime ya, nʼihi na ị hụrụ igwe ahụ na agwakọtara ya na ụrọ apịtị. Dịka mkpịsịụkwụ ya, nke ụfọdụ nʼime ya bụ igwe, ụfọdụ bụkwa ụrọ, na-egosi na akụkụ ụfọdụ nke alaeze ahụ ga-esi ike ma akụkụ ụfọdụ agaghị esi ike ntiwa. Dịka otu ahụ ị hụrụ e siri gwakọta igwe na ụrọ ọnụ, otu a ka ọchịchị alaeze ndị a ga-achọ njikọta alaeze na ibe ya, ma nke a agaghị ekwe mee, dịka ọ gaghị ekwe omume bụ ịgwakọta igwe na ụrọ.

Daniel 2:44-45

“Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi. Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”

Daniel 7:2-8

“Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri. Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya. “Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere. “Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’ “Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị. “Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri. “Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.

Daniel 7:9-10

“Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.

Daniel 7:11-12

“Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. (Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge).

Daniel 7:13-14

“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.

Daniel 7:17-18

‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa. Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’

Daniel 7:19-22

“Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ. Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ. Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa. Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ.

Daniel 7:23-27

“Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile. Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi. Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara. “ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam. Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’

Daniel 8:9-14

Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha. O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala. Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?” Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.”

Daniel 8:15-19

Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m. Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.” Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.” Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m. Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka.

Daniel 8:23-26

“Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili. Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi. Ọ ga-eme ka aghụghọ baa ụba, ọ ga-ahụta onwe ya dịka onye dị elu karịa, mgbe ndị mmadụ na-eche na udo dị, ọ ga-ebibi ọtụtụ ndị. Ọ ga-eguzo megide Onyeisi nke ndịisi, a ga-ebibi ya ma ọ bụghị nʼike nke mmadụ. “Ọhụ a ị hụrụ, maka ụtụtụ na anyasị nke ekpughere gị bụ eziokwu, ma zobe ọhụ a, nʼihi na ọ dịrị ọtụtụ oge ka dị nʼihu.”

Daniel 9:24-27

“Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmanụ. “Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu. Mgbe izu ụka iri isii na abụọ gasịrị, Onye ahụ e tere mmanụ ka a ga-egbu, ma o nweghị ihe ọ ga-enwe. Usuu agha nke onye ọchịchị ga-abịa bibie obodo na ụlọnsọ. Oge ikpeazụ ga-abịa dịka idee mmiri; agha ga-adịgide ruo nʼoge ọgwụgwụ, e kpebiela na ịla nʼiyi ga-adị. Ya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-enwe ọgbụgba ndụ nʼotu ‘izu ụka,’ ọ bụkwa nʼọkara izu ụka ahụ, ka ọ ga-eme ka ịchụ aja na inye onyinye kwụsị. Ọ ga-emekwa ihe arụ dị egwu nʼime ụlọnsọ ahụ, ruo mgbe a ga-awụkwasị ya ọgwụgwụ ahụ bụ nke akara aka nʼahụ onye ọjọọ ahụ.”

Daniel 10:14

Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.”

Daniel 11:27-28

Ndị eze abụọ a, ndị obi ha jupụtara nʼihe ọjọọ ga-anọkọta nʼotu tebul na-agwarịta ibe ha okwu ụgha, ma nzukọ ha agaghị enwe isi, nʼihi ọgwụgwụ ahụ ga-adị mgbe a kara aka ruru. Ọ ga-eji akụnụba dị ukwuu laghachi nʼobodo nke ya ma obi ya ga-adị imegide ọgbụgba ndụ nsọ ahụ. Ọ ga-ebili imegide ya ma mesịa laghachi nʼobodo nke aka ya.

Daniel 11:29-34

“Ma mgbe oge ahụ a kara aka ruru, ọ ga-achịrịkwa ndị agha ya laghachi na ndịda, ma ihe agaghị adị otu ọ dị na mbụ. Ụgbọ mmiri ndị si obodo Kitim ga-abịa imegide ya, ọ ga-ada mba nʼihi egwu, ọ ga-alaghachi azụ were oke iwe megide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. Ọ ga-alọghachi gosi ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nkwado. “Ndị agha ya ga-ebili imerụ ebe ahụ e wusiri ike nke ụlọnsọ ukwu ahụ, kwụsịkwa aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị. Ha ga-ewuli ihe arụ nke na-eweta mbibi. Ọ ga-eji ire ụtọ merụọ ndị ahụ mebiri iwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ndị ahụ maara Chineke ha ga-adị ike guzogide ya. “Ndị niile nwere uche ga-ezi ọtụtụ mmadụ ihe, ma na nwa oge nta, ụfọdụ ga-anwụ site na mma agha, ụfọdụ ka a ga-akpọ ọkụ, ụfọdụ ka a ga-adọta nʼagha, ụfọdụ kwa ka a ga-apụnara ihe ha nwere. Mgbe ha ga-ada, inyeaka ntakịrị ga-abịara ha, ọtụtụ ndị mmadụ ga-ejikwa ụzọ aghụghọ bịa dịnyere ha.

Daniel 11:35

Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị maara ihe ga-asọ ngọngọ, ka ha nwe ike bụrụ ndị a nụchara anụcha, na ndị a sachapụrụ ọcha na ndị emere ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ tutu ruo nʼọgwụgwụ ihe ndị a, nʼihi nʼoge ahụ ga-abịa mgbe akara aka.

Daniel 11:36-39

“Eze ahụ ga-eme ihe ọbụla ọ chọrọ. Ọ ga-agụkwa onwe ya dịka onye dị ukwuu karịa chi niile. Nʼezie, ọ ga-ekwu okwu nkwulu megide Chineke kachasị chi niile. Ma ihe ga-agakwara ya nke ọma tutu mgbe oge ya zuru. Nʼihi na ihe niile ekwuru ga-emezucha. Ọ gaghị akpọ chi nke nna ha maọbụ nke ahụ ụmụ nwanyị na-achọsi ike ihe ọbụla, o nweghị chi ọbụla ọ ga-akpọ ihe nʼihi na ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa ha niile. Kama chi nke ọ ga-asọpụrụ bụ chi nke ebe e wusiri ike, chi nke nna ya ha na-amaghị. Ọ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, na nkume dị oke ọnụahịa na onyinye dara oke ọnụahịa fee chi a. Ọ ga-emegide ebe niile e wusiri ike, nke siri ike site nʼinyeaka chi nke mba ọzọ. Ndị niile nabatara ya ka ọ ga-eme ka nsọpụrụ bara ụba. Ọ ga-eme ha ndị ọchịchị ọtụtụ mmadụ, kenyekwa ha ala dịka ụgwọ ọrụ ha.

Daniel 11:40-45

“Ma nʼoge ikpeazụ, eze ndịda ga-ebuso ya agha, ma eze nke ugwu ga-eji iwe chịkọta ndị agha na-agba ụgbọ agha, ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ji ụgbọ mmiri megide ya. Ọ ga-ebuso ọtụtụ mba agha, kpochapụ ha dịka idee mmiri si ekpochapụ ihe. Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya. Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya. Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya. Ma nʼoge a kwa, ozi ga-esi nʼọwụwa anyanwụ na nʼugwu bịa, nke ga-emenye ya egwu. Nʼihi ya, ọ ga-eji oke iwe pụọ ibibi ọtụtụ ndị ma laakwa ha nʼiyi. Ọ ga-akwụba ụlọeze ya nʼetiti ugwu ọma ahụ dị nsọ na nʼoke osimiri, nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.

Daniel 12:1-4

“Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta. Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi. Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.”

Daniel 12:5-7

Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ. Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?” Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.”

Daniel 12:8-10

Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?” Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara.

Daniel 12:11-13

“Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu. (1,290) Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise (1,335) ahụ gafere. “Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”

Hosiya 2:16

“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.

Juel 2:1-11

Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn. Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji, nʼihi na ụbọchị ikpe nke ONYENWE ANYỊ na-abịa, ọ na-abịaru nso. Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu. Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị. Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ. Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu. Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ, a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa. Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha. Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya, ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha. Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha. Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa. Ha na-ekwogharị dịka ndị agha; ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha. Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị, na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha. Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ. Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị. Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha, ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị. Ha na-enukwasị obodo, na-agbagharị nʼelu mgbidi, na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ; na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile. Ala na-ama jijiji nʼihu ha, eluigwe na-emekwa mkpọtụ. Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị, kpakpando adịghịkwa enye ìhè. Olu ONYENWE ANYỊ dara nʼihu ndị agha, ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ, ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya. Ụbọchị ikpe nke ONYENWE ANYỊ dị ukwu bụrụkwa ihe dị egwu. Onye pụrụ ịnagide ya?

Juel 2:28-29

“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.

Juel 2:30-32

Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị ONYENWE ANYỊ abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu. Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha ONYENWE ANYỊ ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka ONYENWE ANYỊ kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ ONYENWE ANYỊ na-akpọ.

Juel 3:13-16

Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị ONYENWE ANYỊ dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè. ONYENWE ANYỊ ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. ONYENWE ANYỊ ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike.

Juel 3:17-21

“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim. Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile. Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bi na Zayọn.”

Maika 4:1-4

Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, ndị dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. Ọtụtụ mba ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu ONYENWE ANYỊ, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu ONYENWE ANYỊ ga-esitekwa na Jerusalem pụta. Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche, doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge, kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. Onye ọbụla ga-anọdụrụ onwe ya nʼokpuru vaịnị na nʼokpuru osisi fiig ya, nʼihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ. ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya.

Zefanaya 1:14-18

Oke ụbọchị ONYENWE ANYỊ na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị ONYENWE ANYỊ ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ. Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị, ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile. “Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ, mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì, nʼihi na ha emehiela megide ONYENWE ANYỊ. A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu, tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke ONYENWE ANYỊ ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.

Zefanaya 3:8

Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.

Zefanaya 3:9

“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha ONYENWE ANYỊ, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.

Hegai 2:6-9

“Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ. Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. ‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”

Zekaraya 14:1-3

Lee, ụbọchị ONYENWE ANYỊ na-abịa, mgbe a ga-ekesa ihe nkwata gị niile nʼetiti mgbidi gị. Aga m achịkọta mba niile ka ha bịa Jerusalem ibuso ya agha. Ha ga-adọta obodo ahụ nʼagha, tụtụkọọ ihe dị nʼụlọ niile, dinaa ndị inyom nʼike. A ga-adọta ọkara ndị bi nʼobodo ahụ nʼagha, duru ha gaa mba ọzọ. Ma ọkara nke ọzọ ka ha ga-ahapụ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-apụ ibuso ndị mba ọzọ ahụ agha, dịka o si ebu agha nʼụbọchị agha.

Zekaraya 14:4-8

Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda. Unu ga-esi na ndagwurugwu nke ugwu m ahụ gbalaga, nʼihi na ndagwurugwu ahụ ga-eru Azel. Unu ga-agbapụ dịka unu si gbapụ nʼoge gara aga, mgbe ala ọma jijiji ahụ, nʼoge Uzaya bụ eze Juda. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ ya. Nʼụbọchị ahụ, ìhè anyanwụ agaghị adị, oyi agaghị adị, mkpụrụ mmiri agaghị adịkwa. Ọ ga-abụ ụbọchị pụrụ iche, ụbọchị ehihie na abalị na-agaghị adịkwa. Ọ bụ ụbọchị nke naanị ONYENWE ANYỊ maara. Ma ìhè ga-adịkwa nʼoge anyasị. Nʼụbọchị ahụ, mmiri na-enye ndụ ga-esi na Jerusalem na-asọpụta. Ọ ga-ekewa abụọ, ọkara ya ga-asọbanye nʼosimiri Nnu dị nʼihu anyanwụ ebe ọkara nke ọzọ ga-asọbanye nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Ha ga na-asọ nʼọkọchị na nʼudu mmiri.

Zekaraya 14:9

Ma ONYENWE ANYỊ ga-abụ eze nʼelu ụwa niile. Nʼụbọchị ahụ, naanị otu ONYENWE ANYỊ ga-adị, naanị aha ya kwa ka a ga na-efe ofufe.

Zekaraya 14:10-15

Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze. A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu. Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke ONYENWE ANYỊ ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha. Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ. Ọ bụladị Juda ga-ebu agha na Jerusalem. A ga-akwakọrọ akụ ndị mba ọzọ dị ha nso, bụ ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha, na uwe mara mma. Ọrịa ọjọọ dị otu a ga-adakwasị ịnyịnya niile, na ịnyịnya muul, na ịnyịnya kamel niile, na ịnyịnya ibu niile, na anụ niile dị nʼogige ndị agha ha.

Zekaraya 14:16-19

Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ na mba niile ndị ahụ busoro Jerusalem agha, ga-abịa kwa afọ kpọọ isiala nye eze, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ka ha soro mee mmemme ụlọ Ikwu. Ọ bụrụ na ndị ọbụla si na mba dị iche iche esoghị jee Jerusalem ife Eze ahụ, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ha agaghị enwetakwa mmiri ozuzo. Ọ bụrụ na ndị Ijipt ajụ ịga soro ndị ọzọ ife ofufe ahụ, ha agaghị enweta mmiri ozuzo. ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ọrịa ọjọọ ahụ bịakwasị ha, dịka ọ siri bịakwasị mba ndị ahụ niile jụrụ iso mee mmemme ụlọ Ikwu. Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị Ijipt, na ndị mba dị iche iche, ndị na-agaghị eso na mmemme ụlọ Ikwu ahụ.

Zekaraya 14:20-21

Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-ede nʼahụ ataṅụ nke ịnyịnya niile na-anya nʼolu ha bụ nke a: “Ihe dị Nsọ nye ONYENWE ANYỊ.” Ite niile e ji esi nri dị nʼụlọ nke ONYENWE ANYỊ ga-adị ka efere nsọ ndị ahụ dị nʼihu ebe ịchụ aja. Ite niile dị na Juda, na nʼime Jerusalem ga-adị nsọ nye ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. Ndị niile bịara ịchụ aja ga-ewere ụfọdụ nʼime ite ndị a sie nri ịchụ aja ha. Nʼụbọchị ahụ kwa, a gaghị ahụ kwa ndị na-atụ mgbereahịa nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile.

Malakaị 3:2-3

“Ma onye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya ma guzokwa mgbe ọ pụtara ihe? Nʼihi na ọ ga-adị ka ọkụ na-anụcha anụcha, dịkwa ka ncha e ji asụ akwa. Ọ na-anọdụ ala dịka ndị na-anụcha ọlaọcha ime ka ọ dị ọcha. Ọ ga-anụcha ndị Livayị, ime ka ha dị ọcha, dịka ọlaedo na ọlaọcha a nụchara anụcha tutu ruo mgbe ha ga-ewetara ONYENWE ANYỊ onyinye nʼezi omume.

Matiu 13:38-43

Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ. Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze. Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.

Matiu 13:47-50

“Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche. Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma. Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”

Matiu 16:2-3

Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’ Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.

Matiu 16:27-28

Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị. “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”

Matiu 19:28

Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.

Matiu 24:3-8

Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.

Matiu 24:9-14

“Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa.

Matiu 24:15-22

“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara). Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu. Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya. Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya. Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike. Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ. “Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ.

Matiu 24:23-28

Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela. Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara. Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị. “Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela. Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ. Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.

Matiu 24:29-31

“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’ “Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.

Matiu 24:32-39

“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso. Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu. Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga. “Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya. Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa. Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya. Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.

Matiu 24:40-44

Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ. Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ. “Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya. Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.

Matiu 24:45-51

“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere. Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’ ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ. Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.

Matiu 25:1-13

“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra. “Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’ “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’ “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’ “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’ “Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.

Matiu 25:31-33

“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.

Matiu 25:34-40

“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’ “Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ “Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’

Matiu 25:41-46

“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ “Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ “Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

Matiu 26:64

Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”

Mak 8:38

Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”

Mak 9:1

Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”

Mak 13:4-8

“Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?” Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu. Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị. Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.

Mak 13:9-13

“Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha. Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile. Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu. “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.

Mak 13:14-20

“Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla. Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya. Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ. Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi. Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ.

Mak 13:21-23

Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela. Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.

Mak 13:24-27

“Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ, “ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya; kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada, ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’ “Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.

Mak 13:28-37

“Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso. Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ. Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide. “Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya. Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya! Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche. “Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ. Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra. Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”

Mak 14:62

Jisọs sịrị, “Abụ m ya, unu ga-ahụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ ala nʼaka nri nke Onye ji ike niile, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”

Luk 9:26-27

Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ọ ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ. “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke.”

Luk 12:35-40

“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu. Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka. Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi. Ngọzị ga-adịrị ndị ohu ahụ onye nwe ha ga-ahụ ka ha nọ na njikere, ọ bụladị ma ọ lọghachiri nʼetiti abalị, maọbụ nʼezigbo isi ụtụtụ. Maranụ nke a: ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge awa onye ohi ga-eji abịa nʼụlọ ya, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ tiwaa ụlọ ya. Unu kwesiri ịnọ na njikere nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.”

Luk 12:43-47

Ngọzị na-adịrị ohu ahụ nke onyenwe ya ga-ahụ ka ọ na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme onye nke ahụ onyeisi nke ihe niile o nwere. Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị nʼobi ya, ‘Onyenwe m na-anọ ọdụ ịlọta,’ ọ bụrụkwa na ọ malite itigbu ụmụodibo ndị ọzọ, bụ ndị ikom na ndị inyom na-eje ozi, na iri ihe oriri, na ịṅụkwa ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya oke. Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe. “Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike.

Luk 12:54-56

Ọ gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe unu hụrụ urukpu ojii ka ọ na-ebili nʼọdịda anyanwụ, unu na-eme ngwangwa sị, ‘Mmiri ga-ezo,’ ọ na-ezokwa. Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ. Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a?

Luk 17:22-24

Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya. Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha. Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ.

Luk 17:25-30

Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya. “Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ. Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi. “Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ. Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi. “Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè.

Luk 17:31-33

Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita. Chetakwanụ nwunye Lọt. Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya.

Luk 17:34-37

Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ. Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.” Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”

Luk 18:7-8

Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka? Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?”

Luk 21:10-11

Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze. A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe.

Luk 21:12-19

“Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.

Luk 21:20-24

“Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola. Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya. Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru. Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ. Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru.

Luk 21:25-28

“A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.”

Luk 21:29-36

Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso. “Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga. “Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”

Jọn 5:25-29

Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. “Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe.

Jọn 14:2-3

Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi? Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.

Ọrụ Ndị Ozi 1:9-11

Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha. Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”

Ndị Rom 8:18-19

Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke.

Ndị Rom 14:11

E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ”

Ndị Rom 16:20

Mgbe na-adịghị anya, Chineke nke udo ga-azọpịa ekwensu nʼokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.

1 Ndị Kọrint 3:12-15

Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ, ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ. Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ. Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.

1 Ndị Kọrint 4:5

Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.

1 Ndị Kọrint 5:5-6

werenụ nwoke a nyefee nʼaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị lọghachiri. Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo?

1 Ndị Kọrint 15:50-52

Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure. Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche. Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị.

Ndị Filipai 2:10-11

Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto.

Ndị Kọlọsị 3:4

Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.

1 Ndị Tesalonaịka 1:10

na i chere Ọkpara ya onye ga-esi nʼeluigwe, onye o sitere na ndị nwụrụ anwụ kulite, Jisọs, onye na-anapụta anyị nʼiwe nke na-abịa.

1 Ndị Tesalonaịka 4:13-15

Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya. Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ. Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ.

1 Ndị Tesalonaịka 4:16-17

Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

1 Ndị Tesalonaịka 5:1-4

Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ. Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị. Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ. Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi.

1 Ndị Tesalonaịka 5:9-10

Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.

2 Ndị Tesalonaịka 1:4-10

Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu. Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya. Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu. Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè. Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu.

2 Ndị Tesalonaịka 2:1-4

Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola. Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.

2 Ndị Tesalonaịka 2:5-12

Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya? Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru. Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya. Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya. Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha. Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta. Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a. Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe.

1 Timoti 6:14-16

ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe. Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

2 Timoti 3:1-5

Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ. Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya. Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ.

2 Timoti 4:1-5

Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nʼihu Chineke na nʼihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ejikwa m ọbịbịa ya na alaeze ya na-asị gị, kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ. Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ. Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi. Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị.

2 Timoti 4:8

Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.

Taịtọs 2:13

Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst.

Ndị Hibru 1:10-12

Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe. Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”

Ndị Hibru 9:23-28

O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa. Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke. Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ. Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie, otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.

Ndị Hibru 10:25

Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.

Ndị Hibru 11:35

Ụmụ nwanyị natara ndị ha nwụrụ anwụ, site na mbilite nʼọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ, ha jụrụ ịnata mgbapụta ka ha nwee ike nata mbilite nʼọnwụ ka mma.

Jemis 5:1-3

Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu. Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a.

Jemis 5:7-8

Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.

2 Pita 3:3-7

Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.” Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu. Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ. Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.

2 Pita 3:8-9

Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.

2 Pita 3:10-13

Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya. Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.

1 Jọn 2:17-19

Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ. Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.

1 Jọn 4:1-6

Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.

2 Jọn 1:7-11

Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst. Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju. Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya. Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.

Jud 1:14-15

Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya. Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”

Mkpughe 1:1

Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn,

Mkpughe 1:7

“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii. Anya niile ga-ahụkwa ya, ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.” Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.” Otu a ka ọ ga-adị! Amen.

Mkpughe 3:10-12

Ebe i sitere na ntachiobi sọpụrụ okwu m niile, aga m ekpuchi gị site nʼoke mkpagbu ahụ, nke ga-abịakwasị ụwa mgbe a ga-anwale ndị niile bi nʼime ya. Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị. Ma onye ọbụla na-emeri emeri, ka m ga-eme ka ọ bụrụ ogidi nʼime ụlọnsọ Chineke m. Ọ gaghị esikwa nʼebe ahụ pụọ apụọ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nʼahụ, na aha obodo nsọ Chineke, nke bụ Jerusalem ọhụrụ ahụ si nʼeluigwe, ebe Chineke nọ na-arịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nʼihu ya.

Mkpughe 3:15-19

Amaara m ọrụ gị niile, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ gaara adị nnọọ mma ma asị na ị na-ajụ oyi ma ọ bụkwanụ na-ekpo ọkụ. Nʼihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ, ihe ị dị bụ ṅaraṅara. Nʼihi ya, aga m esi nʼọnụ m gbụpụ gị. Nʼihi na ị na-asị, ‘abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ. Ị bụ onye e kwesiri imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ. Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma. Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa.

Mkpughe 4:1

Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.”

Mkpughe 5:1-10

Mgbe ahụ, ahụrụ m akwụkwọ e dere ihe ihu na azụ, nke a fụkọrọ afụkọ, kakwasịkwa ya akara asaa, ka ọ dị nʼaka nri onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ. Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ukwuu, ka ọ na-ekwusa okwu nʼoke olu na-asị, “Ọ bụ onye kwesiri ịnyakapụ akara ndị a ma saghee akwụkwọ ahụ a fụkọrọ afụkọ?” Ma ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ilenye ya anya a hụrụ nʼeluigwe, maọbụ nʼụwa, maọbụ nʼokpuru ụwa. Akwara m akwa nʼobi ilu nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla a hụrụ tozuru oke ịsaghe akwụkwọ ahụ maọbụ ileba anya nʼime ya. Mgbe ahụ, otu onye nʼime ndị okenye ahụ gwara m sị, “Akwala akwa. Lee, Ọdụm ebo Juda, bụ mgbọrọgwụ Devid, emeriela. Ọ pụrụ ịnyakapụ akara asaa ahụ ma saghekwaa akwụkwọ ahụ.” Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile. Ọ gara nʼihu were akwụkwọ ahụ site nʼaka nri onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ. Mgbe ọ weere ya, anụ anọ ahụ dị ndụ na iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dara nʼala nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha niile nʼotu nʼotu jikwa ụbọ akwara na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe jupụtara nʼime ha bụ ụda na-esi isi ụtọ, bụ ekpere ndị nsọ. Ha na-abụ abụ ọhụrụ na-asị, “I kwesiri ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara ya, nʼihi na e gburu gị, ma site nʼọbara gị, ị gbataara Chineke ndị mmadụ, ndị si nʼebo niile, na asụsụ niile, na ndị niile, na mba niile. Ị chịkọtaala ha, mee ha otu alaeze na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nʼụwa.”

Mkpughe 5:11-14

Mgbe ahụ, elere m anya, hụ ma nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi, nke ọnụọgụgụ ha ruru puku kwụrụ puku, na nde kwụrụ nde. Ha gbara ocheeze ahụ gburugburu, na anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ. Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị, “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.” Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ ruo mgbe niile ebighị ebi!” Anụ anọ ahụ dị ndụ zakwara sị, “Amen!” Ndị okenye ahụ dakwara nʼala nʼihu ya kpọọ isiala nye ya.

Mkpughe 6:1-2

Ahụrụ m mgbe Nwa atụrụ ahụ meghere otu nʼime akara asaa ahụ. Otu nʼime anụ anọ ahụ dị ndụ tiri mkpu dịka a ga-asị na ọ bụ egbe eluigwe sị, “Bịa!” Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.

Mkpughe 6:3-4

Mgbe o meghere akara nke abụọ, ngwangwa, anụrụ m ka anụ nke abụọ ahụ nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ tiri mkpu sị, “Bịa!” Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.

Mkpughe 6:5-6

Ma mgbe o meghere akara nke atọ, anụrụ m ka anụ nke atọ ahụ dị ndụ kwuru, “Bịa!” Ahụrụ m ịnyịnya dị ojii. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nʼaka ya. Anụkwara m ihe dị ka olu nke sitere nʼetiti anụ anọ ahụ dị ndụ na-adapụta sị, “Otu ihe ọtụtụ kilo nke ọka wiiti bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị, ihe ọtụtụ kilo atọ nke ọka balị bụkwa ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Ya mere, unu emebikwala mmanụ oliv na mmanya.”

Mkpughe 6:7-8

Mgbe o meghere akara nke anọ, anụrụ m ka anụ nke anọ dị ndụ sịrị, “Bịa!” Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha.

Mkpughe 6:9-11

Ma mgbe ọ meghere akara nke ise, ahụrụ m nʼokpuru ebe ịchụ aja mkpụrụobi ndị niile e gburu egbu nʼihi okwu Chineke na nʼihi ịgba ama nke ha jidesiri ike. Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?” E nyere ha nʼotu nʼotu uwe ọcha, a gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge nta, tutu ruo mgbe ọnụọgụgụ ndị ozi ibe ha na ụmụnna ha a ga-egbu dịka e gburu ha ga-ezu.

Mkpughe 6:12-17

Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara. Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nʼala dịka mkpụrụ osisi fiig na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efegharị ya. Mbara eluigwe gabigara, dịka akwụkwọ mgbe a na-apịakọta ya. Ugwu niile na agwa etiti niile ka e wepụkwara site nʼọnọdụ ha. Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu, ha na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị, “Dakwasịnụ anyị zoo anyị ka onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka oke iwe nke Nwa Atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị. Nʼihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?”

Mkpughe 7:1-3

Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi. Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri, na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.”

Mkpughe 7:4-8

Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel. Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo Manase họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).

Mkpughe 7:9-17

Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị, “Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe, na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.” Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?” Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ. Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha. ‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’ okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ. Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”

Mkpughe 8:1-6

Mgbe o meghere akara nke asaa, akụkụ niile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ. Ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nʼihu Chineke. E nyere ha opi ike nʼotu nʼotu. Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nʼihu ebe ịchụ aja. E nyere ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ ka o jiri chụọ aja, ya na ekpere ndị nsọ niile, nʼebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo, nʼihu ocheeze ahụ. Anwụrụ ọkụ nke ihe ahụ na-esi isi ụtọ, ya na ekpere ndị nsọ sitere nʼaka mmụọ ozi ahụ rigoo elu nʼihu Chineke. Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ tinye ya nʼime ite igwe ntakịrị ahụ, tụda ya, ka ọ danye nʼime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nʼụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe niile nʼụwa. Mgbe ahụ, ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị ji opi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ.

Mkpughe 8:7

Mgbe mmụọ ozi nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara mkpụrụ mmiri na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nʼime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke osisi rechapụrụ ọkụ, e rechapụkwara ahịhịa ndụ niile ọkụ.

Mkpughe 8:8-9

Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwu ọkụ nʼime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere osimiri niile chagharịa ghọọ ọbara. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ihe niile dị ndụ dị nʼime osimiri nwụrụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ụgbọ mmiri niile dị nʼelu osimiri lara nʼiyi.

Mkpughe 8:10-11

Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu nke na-enwu dị ka ọwaọkụ sitere na mbara eluigwe danye nʼime otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere iyi niile na isi iyi niile. Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmiri malitere ilu ilu, ọtụtụ mmadụ nwụrụ nʼihi mmiri a na-elu ilu.

Mkpughe 8:12-13

Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa, otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nʼime atọ e kere kpakpando niile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nʼuju dịka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị, ọ dịkwa otu a nʼoge anyasị. Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.”

Mkpughe 9:1-12

Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ. Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe. Igurube sitere nʼanwụrụ ọkụ ahụ pụta fedakwasa ụwa. E nyekwara ha ike ịta mmadụ ọbụla dịka akpị si agba mmadụ. E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọbụla, maọbụ osisi na ihe ọbụla a kụrụ nʼala. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọbụla na-enweghị akara Chineke nʼegedege ihu ya. Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị a, kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Mmekpa ahụ ha dịka ahụ ụfụ na nhụju anya nke akpị mgbe ọ gbara mmadụ. Nʼime ụbọchị ndị ahụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka ịnyịnya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. Agịrị isi ha dịka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze ha dịkwa ka eze ọdụm. Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha. Ha nwere ọdụdụ dịka akpị. Ma ike niile e nyere ha bụ imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise site nʼike dị nʼọdụdụ ha. Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion. Ahụhụ nke mbụ agafeela, ebe ahụhụ abụọ ọzọ na-abịa nʼihu.

Mkpughe 9:13-21

Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nʼebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nʼihu ocheeze Chineke, na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ, nke ji opi ike okwu, “Tọpụ mmụọ ozi anọ ndị ahụ e kere agbụ nʼebe osimiri Yufretis dị.” A tọhapụrụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e jibu eji na njikere maka oge awa ahụ, na ụbọchị ahụ, na ọnwa ahụ, na afọ ahụ, iji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ. Ndị agha ahụ, ọnụọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị. Nʼime ọhụ m, ahụrụ m ịnyịnya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nʼelu. Ndị nọ nʼelu ịnyịnya ndị a yi ihe ikpuchi obi nke ụfọdụ nʼime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dịka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dịka anwụrụ ọkụ. Isi ịnyịnya ha dịka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ sị ha nʼọnụ na-apụta. E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa. Ike ịnyịnya ndị a dị nʼọnụ ha, na ọdụdụ ha. Ọdụdụ ha dị ka agwọ, nwee isi agwọ nke ha ji emerụ mmadụ ahụ. Ma ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ, bụ ndị a na-egbughị site nʼihe ntaramahụhụ ọrịa ndị a, echegharịghị site nʼọrụ aka ha maọbụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha niile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na bronz na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị na-apụghị ịhụ ụzọ, maọbụ ịnụ ihe, maọbụ ije ije. Ha echegharịghị site nʼigbu mmadụ ha, maọbụ ụzọ mgbaasị ha, maọbụ ndụ ịkwa iko ha, na izu ohi ha pụta.

Mkpughe 10:1-7

Ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nʼeluigwe na-arịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nʼisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dịka anyanwụ. Ụkwụ ya na-acha dịka ogidi na-enwu ọkụ. O ji akwụkwọ ntakịrị a fụkọtara afụkọta nʼaka ya. Otu ụkwụ ya, nke aka nri ya, ka ọ zọnyere nʼime osimiri, ma ụkwụ nke aka ekpe ya ka ọ zọkwasịrị nʼelu ala. O ji oke olu, nke dara ụda dịka ịgbọ ụja ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ. Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nʼeluigwe na-ekwu, “Edela ihe ahụ nʼakwụkwọ, nʼihi na-achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke m hụrụ zọkwasịrị ụkwụ ya nʼelu osimiri, na nʼala akọrọ ahụ, chịlịri aka ya abụọ elu, were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma.

Mkpughe 10:8-11

Olu nke ahụ m nụrụ mbụ sitere nʼeluigwe gwa m okwu ọzọ, na-asị, “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo nʼelu oke osimiri na ala akọrọ, akwụkwọ ahụ aseghere aseghe nke o ji nʼaka ya.” Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ gwa ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ sịrị m, “Nara ya, taa ya. Ọ ga-eme ka afọ gị luo ilu, ma ‘nʼọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dịka mmanụ aṅụ.’” Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ site nʼaka mmụọ ozi ahụ taa ya. Ọ tọrọ ụtọ dịka mmanụ aṅụ nʼọnụ m, ma mgbe m lodara ya, afọ m bidoro ilu ilu. Mgbe ahụ ha sịrị m, “Ị ghaghị ibu amụma ọzọ banyere ọtụtụ mmadụ, na ọtụtụ mba, na ọtụtụ asụsụ na ọtụtụ ndị eze.”

Mkpughe 11:1-6

Enyere m ihe ọtụtụ osisi achara e ji atụ ihe. Agwara m sị m, “Gaa tụọ ụlọnsọ ukwu Chineke, ma tụọkwa ebe ịchụ aja dị nʼụlọnsọ ahụ, gụọ ọnụọgụgụ ndị niile na-akpọ isiala nʼebe ahụ. Ma atụkwala ogige nke dị na mpụta ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ewerela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ. Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260), ha ga-eyi akwa mkpe.” Ndị a bụ osisi oliv abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ, ndị na-eguzo nʼihu Onye nwe ụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a. A ga-enyekwa ha ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzo ọbụla ghara izo nʼụwa nʼime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta niile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa niile nʼoge ọbụla ha chepụtara nʼobi ha.

Mkpughe 11:7-10

Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha. Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe. A gaghị ekwenyekwa ka onye ọbụla lie ozu ha. Ma ndị niile dị iche iche nʼụwa, nʼebo niile, na asụsụ niile, na mba niile ga-agba ozu ha gburugburu ụbọchị atọ na ọkara nʼebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya. Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.

Mkpughe 11:11-14

Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nʼime ha, ha bilitere ọtọ, oke egwu jidere ndị niile hụrụ ha. Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya. Ma nʼotu oge ahụ, nʼotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu mara nke mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ iri nke obodo ahụ niile daa. Ndị nwụrụ nʼoge ala ọma jijiji a dịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị niile fọdụrụ sitere nʼoke egwu nye Chineke nke eluigwe otuto. Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya, ahụhụ nke atọ na-abịa.

Mkpughe 11:15-19

Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke, na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-adị, na onye dịkwaarị, nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị malitekwa ịchị ọchịchị. Mba niile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha, na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị, bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.” Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.

Mkpughe 12:1-6

Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi. Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa. Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya. O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya. Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya. Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).

Mkpughe 12:7-12

Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha, ma e meriri ha, ha enwekwaghị ọnọdụ ọbụla nʼeluigwe. Dragọn ukwu ahụ, bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu maọbụ Setan, nke na-eduhie ndị niile bi nʼụwa. A tụdara ya nʼụwa, ya na ndị mmụọ ozi ya niile. Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke. Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ. Ya mere, ṅụrịanụ ọṅụ eluigwe ma unu ndị niile bi nʼime ya. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼụwa na osimiri nʼihi na ekwensu abịakwutela unu. O jirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge a o nwere ehighị nne.”

Mkpughe 12:13-17

Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nʼụwa, ọ chụsoro nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ ọsọ. Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dịka nku oke ugo, ka o jiri gbanarị agwọ ochie ahụ feba nʼime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii. Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ. Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta. Mgbe ahụ, agwọ ochie ahụ wesara nwanyị ahụ iwe, pụọ ịga buo agha megide ụmụ ya bụ ndị niile fọdụrụ, bụ ndị niile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị ama nke Jisọs.

Mkpughe 13:1-6

Agwọ ochie ahụ guzoro nʼakụkụ nʼọnụ oke osimiri ahụ. Ma ahụrụ m otu anụ ọhịa ka o si nʼime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhịa a nwere isi asaa na mpi iri. Okpueze iri dịkwa nʼelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nʼisi asaa ahụ nʼotu nʼotu bụ ikwutọ na ikwuhie Chineke. Anụ ọhịa a m hụrụ dị ka agụ, ma ụkwụ ya dịka ụkwụ anụ ọhịa bịa. Ọnụ ya dịkwa ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ya, na ocheeze ya na ikike dị ukwuu. Otu nʼime isi ya nwere ọnya buru ibu, nke pụrụ iwetara ya ọnwụ, e mere ka ọnya ahụ laa. Ụwa niile sobere anụ ọhịa ahụ nʼazụ nʼịtụnanya. Ha kpọrọ isiala nye agwọ ochie ahụ nʼihi na o nyere anụ ọhịa ahụ ikike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya, onye pụkwara ibu agha megide ya?” E nyekwara anụ ọhịa ahụ ọnụ na ike ikwu okwu mpako na ikike ikwulu ekwulu ọnwa iri anọ na abụọ. O meghere ọnụ ya malite ikwulu Chineke, na aha ya na ebe obibi ya, na ndụ ahụ bụ ndị bi nʼeluigwe.

Mkpughe 13:7-10

E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile. Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa. Onye nwere ntị ya nụrụ. “Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha. Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha, aghaghị iji mma agha gbuo ha.” Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke.

Mkpughe 13:11-15

Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ. Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ. Ọ na-emekwa ọtụtụ oke ihe ịrịbama dị iche iche. O mere ọbụladị ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nʼụwa nʼihu mmadụ niile. O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ. E nyere ya ike ikunye ume ndụ nʼime oyiyi nke anụ ọhịa mbụ ahụ, ime ka ihe a kpụrụ akpụ kwuo okwu mekwa ka e gbuo ndị niile na-akpọghị isiala nye ya.

Mkpughe 13:16-18

O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha. Ya mere, ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịzụ ahịa maọbụ ree ahịa ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhịa ahụ, maọbụ ihe e ji mara ya, maọbụ ọnụọgụgụ nọchiri aha ya. Nke a ka chọrọ amamihe maka ịghọta ya. Ka onye ọbụla nwere ọgụgụisi, gụọ ọnụọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ, nʼihi na ọ bụ ọnụọgụgụ mmadụ. Ọnụọgụgụ ahụ bụkwa narị isi na iri isi na isii, ya bụ 666.

Mkpughe 14:1-5

Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha. Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ. Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta. Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ. Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.

Mkpughe 14:6-8

Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.” Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”

Mkpughe 14:9-12

Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya, ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”

Mkpughe 14:13

Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.

Mkpughe 14:14-16

Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya. Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.” Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.

Mkpughe 14:17-20

Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ. Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.” Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha. A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.

Mkpughe 15:1

Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.

Mkpughe 15:2-4

Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha. Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ. “Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị, Eze nke mba niile. Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”

Mkpughe 15:5-8

Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha. Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi. Mgbe ahụ ụlọnsọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ si nʼebube na ike Chineke na-apụta. O nweghị onye ọbụla nwere ike ịba nʼụlọnsọ ahụ tutu ruo mgbe ntaramahụhụ asaa nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụchara.

Mkpughe 16:1

Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.”

Mkpughe 16:2

Mmụọ ozi nke mbụ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ụwa, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị mmadụ niile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọrọ oyiyi ya isiala.

Mkpughe 16:3

Mmụọ ozi nke abụọ wụsara ihe dị nʼime efere nke ya nʼelu osimiri niile. Otu mgbe ahụ, osimiri niile chagharịrị ghọọ ọbara dịka nke onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe niile dị ndụ nʼime osimiri ahụ nwụọ.

Mkpughe 16:4-7

Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara. Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị, “I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ, na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a. Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị. Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.” Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị, “E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”

Mkpughe 16:8-9

Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ. Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto.

Mkpughe 16:10-11

Mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ocheeze anụ ọhịa ahụ, mee ka alaeze ya jupụta nʼọchịchịrị. Ndị mmadụ tabiri ire ha nʼihi oke ahụ ụfụ. Ha kọchara Chineke nke eluigwe nʼihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nʼajọ ọrụ ha niile.

Mkpughe 16:12

Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nʼefere ya nʼelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nʼime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị ndị eze ahụ si nʼọwụwa anyanwụ mfe.

Mkpughe 16:13-16

Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ. Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịbama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa niile ịchịkọta ha maka ibu agha nʼụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. “Lee! Ana m abịa dịka onye ohi. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nọ na-eche nche, ndị yi uwe ha na njikere, ka ọ ghara ijegharị nʼọnọdụ ịgba ọtọ, bụrụ onye ọnọdụ ya na-eweta ihere.” Ha kpọkọrọ ndị eze ahụ nʼotu ebe a na-akpọ Amagidọn nʼasụsụ Hibru.

Mkpughe 16:17-21

Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!” Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ. Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya. Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị. Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.

Mkpughe 17:1-7

Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa. Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.” O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke. Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya. Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi: Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn, nne ndị na-akwa iko na nke ihe arụ niile nke ụwa. Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs. Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị m, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m akọwara gị ihe omimi banyere nwanyị a na anụ ọhịa ahụ nke na-ebugharị ya, bụ nke nwere isi asaa na mpi iri.

Mkpughe 17:8-13

Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa. “Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa. Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge. Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi. “Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa. Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.

Mkpughe 17:14-18

Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.” Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche. Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya. Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke. Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”

Mkpughe 18:1-3

Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa. O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’ Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ. Nʼihi na mba niile aṅụọla site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya. Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko, ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.”

Mkpughe 18:4-8

Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya. Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke echetakwala ajọ omume ya niile. Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu. Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere. Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ. Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’ Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị, ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike.

Mkpughe 18:9-22

“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya. Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’ “Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ. Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl. Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ. “Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’ Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike. “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche. Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’ “Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya, na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’ Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’ “Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya, unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ, unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ. Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpe nʼihi mmeso ya megide unu.” Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị, “Otu a ka a ga-esi tufuo Babilọn obodo ukwu ahụ, agaghị ahụkwa ya ọzọ. Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.

Mkpughe 18:23-24

Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa. Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile, na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”

Mkpughe 19:1-6

Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya! Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị. Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe, onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa. Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.” Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Amen, Haleluya!” Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị, “Toonu Chineke anyị, unu ndị ohu ya niile, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.” Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị, “Haleluya! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị.

Mkpughe 19:7-10

Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ. Ka anyị nye ya otuto. Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola, nwunye ya edoziekwala onwe ya. E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.” (Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.) Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.” Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”

Mkpughe 19:11-16

Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha. Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya: Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.

Mkpughe 19:17-18

Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke. Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.”

Mkpughe 19:19-21

Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya. Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.

Mkpughe 20:1-3

Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ. Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.

Mkpughe 20:4-6

Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ. Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị. Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.

Mkpughe 20:7-9

Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta. Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri. Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.

Mkpughe 20:10

Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.

Mkpughe 20:11-15

Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha. Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị. Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ.

Mkpughe 21:1-2

Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.

Mkpughe 21:3-9

Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.” Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye. Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m. Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.” Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”

Mkpughe 21:10-21

O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal. Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu. Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ. Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya. Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ. Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta. Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ. E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ, nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti. Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma.

Mkpughe 21:22-27

O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere. Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ. Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya. A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ. Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.

Mkpughe 22:12

“Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka.

Igbo - Ìgbò - IG

IGBCB'20 - Igbo Contemporary Bible - 2020

This Bible text is from Biblica Open Igbo Contemporary Bible 2020
https://open.bible/bibles/igbo-biblica-text-bible/
provided by: Biblica Inc, available by Creative Commons CC-BY-SA-4.0,
and this new compilation is shared as www.creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0.
Languages are made available to you by www.ipedge.net