22 – Ọrụ ebube

Ndị a bụ okwu dị nsọ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
Anyị enweghị mmasị n'okwu ụmụ mmadụ.
Maka onye ọ bụla hụrụ Chineke n'anya ... Nke a bụ ihe Chineke na-ekwu banyere: Ọrụ ebube.

Top 3 Kasị Mkpa Amaokwu

Matiu 10:1

Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche.

Mak 11:22-24

Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa. Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.

Ọrụ Ndị Ozi 5:12-16

Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Ha niile na-ezukọ na mgbe ụlọ Solomọn. O nweghị onye ọbụla kwere iso ha ọzọ, nʼagbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-asọpụrụ ha. Ma otu ọ dị, ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwanyị kwere nʼOnyenwe anyị sonyere ha. Nʼihi nke a, ndị mmadụ bupụtara ndị ọrịa nʼokporoụzọ nibe ha nʼute na ihe ndina, ka ọ ga-abụ mgbe Pita na-agafe onyinyo ya ga-adakwasị ụfọdụ nʼime ha. Igwe mmadụ zukọtara site nʼobodo ndị dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị nrịa nrịa, na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu, a gwọkwara ha niile.

Amaokwu ọ bụla n'usoro Canonical – 266 amaokwu

Jenesis 1:1-3

Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara.

Jenesis 2:7

ONYENWE ANYỊ Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ.

Jenesis 41:15-16

Fero gwara Josef sị, “Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara.” Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.”

Ọpụpụ 3:2-5

Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke ONYENWE ANYỊ mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ. Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.” Mgbe ONYENWE ANYỊ hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.” Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”

Ọpụpụ 4:2-5

Ma ONYENWE ANYỊ jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Gịnị ka i ji nʼaka?” Mosis zara sị, “Ọ bụ mkpanaka.” ONYENWE ANYỊ sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ. ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka. ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na i mee ihe ịrịbama a, ha ga-ekwere ihe ị gwara ha. Ha ga-aghọta na ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna ha, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb gosiri gị onwe ya.”

Ọpụpụ 4:6-9

ONYENWE ANYỊ gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ. Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a. Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.”

Ọpụpụ 4:30-31

Erọn gwara ha ihe niile ONYENWE ANYỊ gwara Mosis. Mosis, nʼonwe ya mere ihe ịrịbama ahụ niile nʼihu anya ha. Mgbe ahụ, ha kwenyere; dịka ha nụrụ na ONYENWE ANYỊ eletala ụmụ Izrel, ma hụkwa ahụhụ ha. Ha kpọrọ isiala fee ya ofufe.

Ọpụpụ 7:3

Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt,

Ọpụpụ 7:9-12

“Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.” Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ. Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha. Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ.

Ọpụpụ 7:20-23

Mosis na Erọn mere dị ka ONYENWE ANYỊ nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara. Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile. Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara. Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka ONYENWE ANYỊ gwara ha na ọ ga-eme. Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere.

Ọpụpụ 8:1-7

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe. Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala Ijipt niile. Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka. Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’ ” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Gwa Erọn, ‘Setịpụ aka gị ya na mkpanaka gị nʼelu osimiri niile, na mmiri nta na ọdọ mmiri ndị Ijipt, mee ka awọ jupụta ala Ijipt niile.’ ” Erọn setịpụrụ aka nʼelu mmiri niile nke Ijipt, awọ pụtara kpuchie ala ahụ niile. Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ihe ahụ Mosis na Erọn mere. Ha mekwara ka awọ jupụta ala ahụ niile.

Ọpụpụ 8:16-19

Ya mere, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.” Mosis na Erọn mere nke a. Mgbe Erọn setịpụrụ aka tie mkpanaka ya nʼelu ala, anwụ nta jupụtara nʼala Ijipt niile, nʼahụ ndị mmadụ, na nʼahụ anụmanụ ha. Ndanda ndị a jupụtakwara nʼuzuzu niile dị nʼala ahụ. Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile. Naanị ihe ndị na-eme majiki gwara Fero bụ, “Nke a bụ akaọrụ Chineke.” Ma Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ chọghị ige, ọ bụladị ndị majiki ya ntị, dịka ONYENWE ANYỊ kwuru na ọ ga-eme.

Ọpụpụ 8:20-24

ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. Ọ bụrụ na ị chọghị ime otu a, aga m eme ka igwe ijiji jupụta nʼala Ijipt niile. Ha ga-ejupụta gị nʼahụ na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi, na nʼahụ ndị gị niile, na nʼime ụlọ unu niile. “ ‘Nʼụbọchị ahụ, igwe ijiji ndị a agaghị emetụ ndị nọ na Goshen ebe ndị m bi. Mgbe ahụ ka ị ga-amata na mụ bụ ONYENWE ANYỊ bịara ije nʼala a. Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’ ” Nʼechi ya, ONYENWE ANYỊ mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie.

Ọpụpụ 9:1-7

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.” Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha, aka ONYENWE ANYỊ ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu. ONYENWE ANYỊ ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ” ONYENWE ANYỊ ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka ONYENWE ANYỊ ga-eme ihe dị otu a nʼala a.” Nʼụtụtụ echi ya, ONYENWE ANYỊ mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.

Ọpụpụ 9:8-12

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero. Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.” Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile. Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ. Ma ONYENWE ANYỊ mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na ọ ga-eme.

Ọpụpụ 9:22-27

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.” Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, ONYENWE ANYỊ zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, ONYENWE ANYỊ zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt. Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba. Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi. Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi. Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. ONYENWE ANYỊ bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ.

Ọpụpụ 10:12-16

ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị nʼala Ijipt ka igurube jupụta na ya, kpuchie ebe niile, richapụ ihe niile na-eto eto dị nʼala ahụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ hapụrụ.” Ya mere, Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼelu ala Ijipt, ONYENWE ANYỊ mere ka ifufe nke si nʼebe anyanwụ si awa fee nʼụbọchị ahụ niile na abalị ahụ niile. Nʼụtụtụ ya, ifufe ahụ si nʼebe anyanwụ si awa bubatara igurube ndị ahụ. Ha niile kpuchichara ala Ijipt niile, site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ. Nke a bụ mbata igurube kachasị ibe ya njọ nʼIjipt. Ijipt agaghị enwekwa nke dịka ya ọzọ. Ha kpuchiri ala niile ruo mgbe ọchịchịrị gbachiri ya. Ha richapụrụ ihe niile na-eto nʼubi, na mkpụrụ niile na-amị nʼosisi, bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ukwu ahụ hapụrụ. Nʼikpeazụ, ọ dịghị ahịhịa ndụ fọdụrụ nʼala ma nʼelu osisi nʼIjipt niile. Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu.

Ọpụpụ 10:21-23

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị abụọ nʼeluigwe ka ọchịchịrị gbaa nʼala Ijipt niile.” Mosis setịpụrụ aka ya nʼeluigwe. Oke ọchịchịrị gbara abalị atọ nʼala Ijipt niile. Ndị Ijipt ahụghị ihu ibe ha. Ha ahapụghịkwa ebe obibi ha abalị atọ ahụ. Ma ụmụ Izrel nwere ìhè nʼebe niile ha bi.

Ọpụpụ 12:29-33

Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ. Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị. Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee ONYENWE ANYỊ unu ofufe dịka unu rịọrọ. Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.” Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.”

Ọpụpụ 14:19-29

Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke, onye na-aga nʼihu ndị agha Izrel, sitere nʼihu pụọ gaa nọdụ nʼazụ ha. Otu a kwa, ogidi igwe ojii ahụ sitere nʼihu gaa nʼazụ ha. Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ. Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. ONYENWE ANYỊ ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha. Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile. Nʼisi ụtụtụ echi ya, ONYENWE ANYỊ ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha. O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.” Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.” Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma ONYENWE ANYỊ mere ka osimiri ahụ kpuchie ha. Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.

Ọpụpụ 15:26

Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”

Ọnụọgụgụ 12:6

ONYENWE ANYỊ gwara ha sị, “Geenụ ntị nʼokwu m ndị a: “Mgbe onye amụma nọ nʼetiti unu, Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ na-egosi ya onwe m site nʼọhụ. Ana m agwa ya okwu site na nrọ.

Ọnụọgụgụ 14:22

Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a,

Diuteronomi 4:11-13

Ọ bụ nʼala ugwu ahụ ka unu bịara nso, guzo, mgbe ọkụ si nʼugwu ahụ na-ere, na-alali elu iru eluigwe, ya na igwe ojii nakwa oke ọchịchịrị. Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼọkụ ahụ gwa unu okwu. Unu nụrụ ụda olu ya, ma unu ahụghị oyiyi ọbụla anya, naanị ụda olu. O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ.

Diuteronomi 4:33-34

O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị? O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ?

Diuteronomi 6:22

Nʼihu anyị, ONYENWE ANYỊ zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile.

Diuteronomi 7:15

ONYENWE ANYỊ ga-ewepụrụ unu ọrịa niile. Ọ gaghị ekwe ka ọrịa ndị Ijipt ọbụla, nke unu na-echeta nke ọma dakwasị unu, ọrịa ndị a niile ka ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị iro unu!

Diuteronomi 7:19

Unu ji anya unu hụ ọnwụnwa ukwuu niile, ihe ịrịbama niile na ihe ebube niile, nʼaka ahụ dị ike na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, nke ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ji kpọpụta unu. ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ga-emekwa otu ihe ahụ nʼebe ndị niile a unu na-atụ egwu ugbu a.

Diuteronomi 8:3-4

E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ pụta. Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.

Diuteronomi 34:10-12

Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis, onye ya na ONYENWE ANYỊ kparịtara ụka ihu na ihu, onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke ONYENWE ANYỊ ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.

Joshua 3:14-17

Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu. Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

Joshua 6:15-20

Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na ONYENWE ANYỊ enyela unu obodo a! Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye ONYENWE ANYỊ. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ. Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile. Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye ONYENWE ANYỊ. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ ONYENWE ANYỊ.” Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.

Joshua 10:12-13

Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara ONYENWE ANYỊ okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon” Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu.

Ndị Ikpe 14:5-6

Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin. Nʼotu oge ahụ, Mmụọ ONYENWE ANYỊ bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere.

Ndị Ikpe 16:29-30

Mgbe ahụ, Samsin jidesiri ogidi abụọ dị nʼetiti ụlọ ahụ aka ike, aka nri ya nʼotu, aka ekpe ya na nke ọzọ. Samsin kpere ekpere sị, “Ka m soro ndị Filistia nwụọ!” O ji ike ya niile nuo ogidi ahụ aka. Otu mgbe ahụ kwa, ụlọ arụsị ahụ dara, dakwasị ndịisi ọchịchị Filistia ndị ahụ, na ndị niile nọ nʼime ụlọ ahụ. Ya mere, ndị niile so Samsin nwụọ nʼoge ahụ dị ọtụtụ karịa ndị Samsin gburu mgbe ọ dị ndụ.

1 Samuel 5:2-4

Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn, dọba ya nʼakụkụ Dagọn. Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya. Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ.

1 Samuel 5:6-12

Aka ONYENWE ANYỊ malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile. Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, “Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn.” Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?” Ha zara, “Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat.” Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat. Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka ONYENWE ANYỊ malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ. Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn. Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, “Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!” Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ. Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.

1 Samuel 6:19-20

Ma ONYENWE ANYỊ tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile ONYENWE ANYỊ tigburu. Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?”

1 Samuel 17:34-37

Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ! ONYENWE ANYỊ ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka ONYENWE ANYỊ nọnyere gị.”

1 Samuel 17:45-51

Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. Taa ka ONYENWE ANYỊ ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel. Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na ONYENWE ANYỊ adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke ONYENWE ANYỊ, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.” Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya. Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala. Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya. Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya! Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ.

2 Samuel 6:6-7

Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ. Ma iwe ONYENWE ANYỊ dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.

1 Ndị Eze 17:1

Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha ONYENWE ANYỊ Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”

1 Ndị Eze 17:12-16

Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ONYENWE ANYỊ Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.” Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri. Nʼihi na nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ ONYENWE ANYỊ ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ” Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya. Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu ONYENWE ANYỊ kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.

1 Ndị Eze 17:17-24

Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya. Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?” Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya. Ọ kpọkuru ONYENWE ANYỊ sị ya, “ONYENWE ANYỊ Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?” Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo ONYENWE ANYỊ, sị, “Biko, ONYENWE ANYỊ Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.” ONYENWE ANYỊ nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ. Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!” Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”

1 Ndị Eze 18:32-39

O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu. Ọ tụkwasịrị nkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, tụkwasịkwa otu oke ehi o gbujasịrị nʼelu nkụ ndị ahụ. Emesịa, o nyere ndị nọ nʼebe ahụ iwu sị ha, “Gbajuonụ ite anọ mmiri. Butekwanụ mmiri ahụ bịa wụkwasị ya nʼelu aja nsure ọkụ a, na nʼelu nkụ ndị a.” Mgbe ha mesiri nke a, Ịlaịja gwara ha okwu sị, “Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru. Ịlaịja nyekwara ha iwu sị, “Gbajukwaanụ ya nke ugboro atọ, bịa wụkwasị ya.” Ha mekwara otu a. Mmiri jupụtakwara nʼebe ịchụ aja ahụ, na olulu ahụ dị ya gburugburu. Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, ONYENWE ANYỊ Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile. Biko, ONYENWE ANYỊ m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị Izrel niile mata na gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke, na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị.” Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ. Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “ONYENWE ANYỊ, ya onwe ya bụ Chineke! ONYENWE ANYỊ ya onwe ya bụ Chineke!”

2 Ndị Eze 2:8

Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.

2 Ndị Eze 2:11-14

Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe. Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ. Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan. O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe ONYENWE ANYỊ, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.

2 Ndị Eze 2:23-24

Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!” Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha ONYENWE ANYỊ. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.

2 Ndị Eze 4:2-7

Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?” Nwanyị ahụ zara sị, “O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ.” Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole. Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.” Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha. Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.” Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta. Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, “Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu.”

2 Ndị Eze 4:32-35

Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya. Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo ONYENWE ANYỊ. Emesịa, ọ makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ. Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ.

2 Ndị Eze 4:40-44

Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya. Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ. Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.” Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?” Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ” Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu ONYENWE ANYỊ si dị.

2 Ndị Eze 5:10-14

Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.” Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha ONYENWE ANYỊ Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m. Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ. Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’ ” Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.

2 Ndị Eze 6:5-7

Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.” Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, “Ebee ka ọ dabara?” Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri. Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya.

2 Ndị Eze 6:8-12

Nʼoge a, eze ndị Aram na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.” Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.” Nʼihi nke a, eze Izrel mere nchọpụta banyere ebe ahụ onye nke Chineke gwara ya. Ọtụtụ mgbe Ịlaisha dọrọ eze aka na ntị, nʼihi ya, ha nọrọ na nche nʼebe ahụ niile. Ihe ndị a mere ka iwe wee eze ndị Aram. Ọ kpọkọtara ndịisi ọrụ ya nye ha iwu sị, “Gwanụ m, onye nʼime anyị dịnyere eze Izrel?” Otu onye nʼime ndị ọchịagha ya sịrị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị, onyenwe m bụ eze. Ọ bụ Ịlaisha, onye amụma Izrel, bụ onye na-agwa eze Izrel okwu niile i na-ekwu nʼime ebe ndina gị.”

2 Ndị Eze 6:15-20

Mgbe onye na-ejere onye nke Chineke ozi biliri ọtọ nʼisi ụtụtụ pụọ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị agha na ịnyịnya na ụgbọala, ka ha gbara obodo ha nọ gburugburu. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m, gịnị ka anyị ga-eme ugbu a?” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Atụla egwu, nʼihi na ndị nọnyere anyị dị ọtụtụ karịa ndị nọnyeere ha.” Mgbe ahụ, Ịlaisha kpere ekpere sị, “ONYENWE ANYỊ, biko, saghee anya ya abụọ ka ọ hụ.” ONYENWE ANYỊ meghere anya ohu Ịlaisha, mee ka ọ hụ ịnyịnya ọkụ, na ụgbọala ọkụ jupụtara nʼugwu dị gburugburu ebe ahụ niile. Mgbe ndị iro ahụ na-abịaru ya nso, Ịlaisha kpọkuru ONYENWE ANYỊ nʼekpere sị, “Mee ka ìsì kpuo ndị agha niile.” O mekwara ka ìsì kpuo ha, dịka Ịlaisha rịọọrọ. Ịlaisha pụtara sị ha, “Nke a abụghị ụzọ, nke a abụkwaghị obodo unu na-achọ. Soronụ m, ka m gosi unu nwoke unu na-achọ.” O duuru ha jee Sameria. Mgbe ha bịaruru Sameria, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Biko, ONYENWE ANYỊ, ugbu a meghee anya ha, ka ha hụ ụzọ.” ONYENWE ANYỊ meghere anya ha dịka Ịlaisha kpere nʼekpere; ha matakwara na ha nọ na Sameria.

2 Ndị Eze 13:21

Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.

2 Ndị Eze 20:9-11

Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama ONYENWE ANYỊ nye gị na ONYENWE ANYỊ ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?” Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.” Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ ONYENWE ANYỊ ka o meere Hezekaya nke a. ONYENWE ANYỊ mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.

2 Ihe E Mere 16:12

Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka ONYENWE ANYỊ kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru.

2 Ihe E Mere 26:16-20

Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja. Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja ONYENWE ANYỊ iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ. Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka ONYENWE ANYỊ Chineke gị.” Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu. Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ tiri ya ihe otiti.

Nehemaya 9:10

I gosiri Fero na ndịisi ọchịchị ya na ndị ya niile ọtụtụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube nʼihi na ị hụrụ otu ha siri site na nganga juru ha obi mesoo ndị gị mmeso ọjọọ. Ụwa niile maara aha gị taa nʼihi ọrụ ebube ndị a niile ị rụrụ.

Job 5:8-9

“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile. Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.

Job 13:4

Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.

Abụ Ọma 30:2

O ONYENWE ANYỊ Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m.

Abụ Ọma 41:3-4

ONYENWE ANYỊ na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike, meekwa ka ahụ dị ha mma. Ekwuru m sị, “O ONYENWE ANYỊ, meere m ebere; gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.”

Abụ Ọma 77:14

Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.

Abụ Ọma 103:3-5

ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.

Abụ Ọma 147:3

Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.

Aịzaya 7:14

Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.

Aịzaya 53:5

Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị: ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ. E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ; ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.

Jeremaya 30:17

Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’

Jeremaya 32:20-21

Ọ bụ gị mere ihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche nʼIjipt. Ị nọgidekwara na-arụ ha ruo taa, ma nʼala Izrel ma nʼetiti ndị niile nọ nʼụwa. Nʼihi ya, i meere onwe gị aha nke ka bụkwa nke gị nʼebe niile. Ọ bụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche, nʼaka dị ike, na ogwe aka e setịpụrụ esetipụ, nʼihe oke egwu, ka i ji kpọpụta ndị gị Izrel site nʼIjipt.

Izikiel 37:1-10

Aka nke ONYENWE ANYỊ dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ. O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ. Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?” Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ọ bụ naanị gị onwe gị maara.” Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke ONYENWE ANYỊ. Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ. Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha. Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’ ” Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.

Daniel 2:26-30

Eze jụrụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), “I nwere ike ịgwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ, na ịkọwara m ihe ọ pụtara?” Daniel gwara eze, “O nweghị onye amamihe ọbụla, onye ọbụla ya na mmụọ na-ekwu okwu, onye mgbaasị ọbụla maọbụ onye na-enyocha kpakpando ọbụla pụrụ ịgwa eze ihe omimi a ị chọrọ. Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a: “Ihe ị rọrọ na nrọ, gị bụ eze, bụ ihe banyere ihe na-aga imezu nʼoge dị nʼihu. Onye ahụ na-ekpughe ihe nzuzo niile egosikwala gị ihe nke ga-eme. Ma mụ onwe m, ekpugheghị ihe omimi a nye m nʼihi na m karịrị mmadụ ọbụla dị ndụ nʼamamihe, kama ọ bụ ka gị bụ eze mata nkọwa ya ma ghọtakwa ihe gabigara nʼuche gị.

Daniel 3:19-30

Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri. Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu. Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu. Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike. Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.” Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.” Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!” Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta. Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha. Mgbe ahụ, Nebukadneza sịrị, “Otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak na Abednego nʼihi na o zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi, mgbe ha jụrụ ime ihe eze nyere nʼiwu, kama ha jiri aka ha họrọ ịnwụ, kama ife chi ọzọ nke na-abụghị Chineke nke ha. Ya mere, ana m enye iwu a taa, na-asị na onye ọbụla, maọbụ mba ọbụla, maọbụ asụsụ ọbụla, onye kwuru okwu ọjọọ megide Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-etikpọkwa ụlọ onye ahụ, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. Nʼihi na o nweghị chi ọzọ nke pụrụ ịzọpụta nʼụzọ dị otu a.” Mgbe ahụ, eze nyere Shedrak, Mishak na Abednego ọkwa ọzọ dị elu karịa nke ha nwere na mbụ nʼala Babilọn.

Daniel 4:1-3

Mụ bụ Nebukadneza, Na e zigara mmadụ niile, mba niile, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nʼụwa ozi: Ka ọ dịrị unu na mma! E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m. Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Daniel 5:5-6

Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ. Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha.

Daniel 6:16-24

Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.” E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe. Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra. Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ. Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?” Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile! Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.” Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi. Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala.

Daniel 6:25-27

Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa. “Ka ọ dịrị unu na mma. “Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel. “Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ, nke na-adịgide ebighị ebi. E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi, ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa. Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube nʼeluigwe na nʼụwa. Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel site nʼike ọdụm.”

Juel 2:28-31

“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị ONYENWE ANYỊ abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu.

Matiu 4:23-24

Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke Galili, na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ. Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile.

Matiu 8:2-3

Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara.

Matiu 8:14-15

Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ. Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi.

Matiu 8:16-17

Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.”

Matiu 8:24-27

Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.” Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii. O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”

Matiu 8:28-34

Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha. Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?” Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.” Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya. Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.

Matiu 9:2-8

Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.” Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.” Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu? Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’? Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, chịrị ute gị laa!” Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya. Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a.

Matiu 9:20-22

Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nʼọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nʼazụ bịaruo ya nso, metụ ọnụ uwe ya aka. Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ ọnụ uwe ya aka, a ga-agwọ m.” Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.

Matiu 9:23-26

Mgbe Jisọs batara nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ndị Juu ahụ, hụ igwe mmadụ ka ha na-atụ ụzụ na ndị na-egbu ọja. Ọ sịrị ha, “Sinụ ebe a pụọ, nwata nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ nọ nʼụra.” Ma ha chịrị ya ọchị. Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ. Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ.

Matiu 9:27-31

Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!” Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.” O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.” Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha “Unu agwakwala onye ọbụla.” Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe niile nʼala ahụ.

Matiu 9:32-33

Mgbe ndị a sitere nʼebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere ya nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nʼime ya. Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụtụbeghị ihe dị otu a nʼala Izrel.”

Matiu 9:35

Jisọs jegharịrị nʼobodo niile na ogbe niile dị nʼebe ahụ, ma ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nʼụlọ ekpere ndị Juu, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche.

Matiu 10:1

Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche.

Matiu 10:8

Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.

Matiu 11:5

Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye.

Matiu 12:10-13

Nʼebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nʼebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ mmadụ nʼụbọchị izuike?” Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu nwere otu atụrụ danyere nʼime olulu nʼụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ ya nʼebe ahụ? Ọ gaghị ejide ya dọpụta ya? Mmadụ ọ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, o ziri ezi nʼiwu bụ ịrụ ọrụ ọma nʼụbọchị izuike.” Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.

Matiu 12:15

Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile.

Matiu 12:22-23

Emesịa, ha kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ, bidokwa ikwu okwu. Ihe a juru igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ anya. Nʼihi ya, ha kwuru sị, “Nwoke a, ọ ga-abụ Nwa Devid?”

Matiu 12:28

Ma ọ bụrụ na m na-esite nʼike Mmụọ nke Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nʼetiti unu.

Matiu 13:58

Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.

Matiu 14:14

Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha.

Matiu 14:15-21

Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.” Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.” Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.

Matiu 14:25-27

Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu. Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, “Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu.”

Matiu 14:28-33

Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.” Ọ sịrị ya, “Bịa!” Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs. Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!” Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!” Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.”

Matiu 14:35-36

Mgbe ndị obodo ahụ matara na ọ bụ ya, ha zisara ozi gburugburu obodo niile ahụ, ma dutere ya ndị niile ahụ na-adịghị ike. Ha rịọrọ ya ka o kwenye ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ya aka ka a gwọrọ.

Matiu 15:22-28

Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.” Ma ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!” Ọ zara sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” Ma ọ bịara daa nʼụkwụ ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nyere m aka!” Ọ zara sị, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.” Ọ zara sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala.” Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe ị na-arịọ.” Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

Matiu 15:30-31

Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile. Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel.

Matiu 15:32-38

Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?” Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa. Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị.

Matiu 17:2

Nʼebe ahụ a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha, ihu ya na-enwupụ dị ka anyanwụ, uwe ya chapụkwara dị ka ìhè.

Matiu 17:14-18

Mgbe ha bịarutere nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, otu nwoke bịakwutere ya gbuo ikpere nʼihu ya, rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nʼihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọ na-ata oke ahụhụ, ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nʼime ọkụ maọbụ nʼime mmiri. Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” Jisọs zara sị, “Unu ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtaranụ m nwata ahụ nʼebe a.” Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nʼime nwata ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, nwata ahụ bụ onye agwọkwara nʼotu oge ahụ.

Matiu 17:19-20

Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị ugwu a, ‘Site nʼebe a wezuga onwe gị,’ ọ ga-apụtakwa. Ọ dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime.

Matiu 17:27

Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”

Matiu 18:18-20

“Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe. “Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.”

Matiu 19:26

Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.”

Matiu 20:30-34

Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.” Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.

Matiu 21:14

Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha.

Matiu 21:19-22

Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?” Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa. Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”

Matiu 28:2

Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya.

Matiu 28:6-7

Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu. Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”

Matiu 28:18

Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.

Mak 1:23-28

Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!” Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta. Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.” Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.

Mak 1:29-31

Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru. Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya. Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa.

Mak 1:32-34

Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha. Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ. Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.

Mak 1:39

Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.

Mak 1:40-45

Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha. Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya, ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.

Mak 2:3-12

Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya. Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.” Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị, “Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?” Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu? Olee nke ka mfe: ọ bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ i sị, ‘Bilie chịrị ute gị jegharịa?’ Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị.” O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”

Mak 3:1-5

Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ. Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike. Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bilie guzoro nʼetiti ebe a.” Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị. O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.

Mak 3:10-12

Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka. Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” Ma ọ na-enyesi ha iwu ike ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ.

Mak 3:14-15

Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma, nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.

Mak 4:37-41

Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii. Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”

Mak 5:2-17

Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya. Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ. Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.” Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!” Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.” Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ. Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.” Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile. Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere. Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha. Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ. Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha.

Mak 5:25-34

Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ. Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.” Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya. Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’  ” Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya. Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile. Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.”

Mak 5:35-42

Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?” Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.” O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis. Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!” Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”). Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu.

Mak 6:2

Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ?

Mak 6:5

Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha.

Mak 6:7

Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.

Mak 6:13

Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, teekwa ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike mmanụ, gwọọ ha.

Mak 6:35-44

Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala. Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.” Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?” Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.” Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ. Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ. Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. Ha niile riri rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ. Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.

Mak 6:48-51

Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha. Ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, tie mkpu akwa. Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha. Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu.” Emesịa, ọ rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu.

Mak 6:54-56

Ma ngwangwa ha pụtara nʼụgbọ, ndị nọ nʼebe ahụ matara onye ọ bụ. Ha gbaara ọsọ gaa nʼobodo nta niile dị ebe ahụ gburugburu butere ya ndị ọrịa nʼute ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ. Ebe ọbụla ọ bara, nʼobodo ukwu maọbụ na obodo nta, maọbụ nʼubi, ndị mmadụ na-ebute ndị ọrịa nibe ha nʼahịa. Ha rịọrọ ya ka o kwere ka ha metụ ọ bụladị ọnụnụ uwe ya aka; ndị niile metụrụ ya aka nwetara ọgwụgwọ.

Mak 7:24-30

Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa. Nʼebe ahụ ọ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na ọ chọghị ka a mata na ọ nọ ebe ahụ. Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, ọ bịara daa nʼụkwụ ya. Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. Ọ rịọrọ ya ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị. Ọ sịrị ya, “Hapụ ka ụmụntakịrị buru ụzọ rie ihe, nʼihi na o zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.” Ma ọ zaghachiri ya sị, “Onyenwe m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri ụmụntakịrị si na tebul tụpụ nʼala.” Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Nwanyị, ị zara nke ọma, nʼihi ọsịsa gị, laa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwanyị ugbu a.” Ọ laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala.

Mak 7:32-37

Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka. O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire. O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!” Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma. Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile. Ọ tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu.”

Mak 8:1-9

Nʼoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri. Ọ bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa.” Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?” Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha zara sị, “Asaa.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ. Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya. Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa. Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha.

Mak 8:22-25

Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka, Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị na-ahụ ihe ọbụla?” Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị.” Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma.

Mak 9:2-3

Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha. Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha.

Mak 9:17-27

Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi. Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.” Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!” Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya. Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta. Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.” Jisọs sịrị ya, “ ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.” Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!” Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!” O tiri mkpu nʼoke olu, nugharịa nwata ahụ nke ukwuu ma site nʼime ya pụta. Nwata ahụ tọgbọrọ nʼala dị ka onye nwụrụ anwụ nke mere na ndị niile nọ nʼebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!” Ma Jisọs jidere ya nʼaka selite ya elu, mee ka o guzo nʼụkwụ ya. O guzokwara.

Mak 10:27

Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.”

Mak 10:46-52

Mgbe ha ruru Jeriko, dị ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ sitere nʼobodo Jeriko na-apụ, otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs (aha ya pụtara “nwa nwoke Timiọs”), onye arịrịọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ. Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!” Ọtụtụ mmadụ bara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọgidesịrị ike na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere m ebere!” Jisọs kwụsịrị kwuo sị, “Kpọọnụ ya.” Ya mere ha kpọrọ onye ìsì ahụ, sị ya, “Mesaa ihu gị bilie nʼụkwụ gị, ọ na-akpọ gị.” Ọ tufuru uwe mwụda ya, wulie nʼụkwụ ya, bịakwute Jisọs. Jisọs sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ sịrị ya, “Onye ozizi m, achọrọ m ka m hụ ụzọ.” Jisọs sịrị ya, “Laa, okwukwe gị azọpụtala gị.” Nʼotu oge ahụ, o bidoro ịhụ ụzọ, sorokwa ya gawa nʼụzọ ahụ.

Mak 11:22-24

Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke. Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa. Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.

Mak 16:6

Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.

Mak 16:17-18

Ihe ịrịbama ndị a ga-esokwa ndị kwerenụ. Site nʼaha m, ha ga-achụpụ mmụọ ọjọọ; kwuokwa okwu nʼasụsụ ọhụrụ dị iche iche. Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.”

Mak 16:19

Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe, ebe ọ nọdụ ala nʼakụkụ aka nri Chineke.

Mak 16:20

Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.

Luk 1:37

Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.”

Luk 4:33-37

Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu, “Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!” Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ. Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!” Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu.

Luk 4:38-39

Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka. O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa.

Luk 4:40-41

Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha. Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst.

Luk 5:4-9

Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.” Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.” Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị. Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu. Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.” Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.

Luk 5:12-15

Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya. O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa.

Luk 5:17-26

Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa. Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya. Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.” Ndị Farisii na ndị ozizi iwu malitere iche nʼime obi ha sị, “Onye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie, ma ọ bụghị naanị Chineke?” Mgbe Jisọs matara ihe ha na-ajụ, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ndị a nʼobi unu? Olee nke ka mfe ikwu: Ọ bụ a gbagharala gị mmehie gị niile, ka ọ bụ ị sị, Bilie jee ije? Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!” Ngwangwa, o biliri ọtọ nʼihu mmadụ niile, chịrị ihe ndina ya bido na-eto Chineke na-ala nʼụlọ ya. Ihe ndị a juru onye ọbụla anya, ha tokwara Chineke. Oke egwu jupụtakwara ha nʼahụ, ha sịrị, “Anyị ahụla ihe ebube taa.”

Luk 6:6-10

Nʼụbọchị izuike ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ. Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; ọ bụ ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Mgbe o lesiri ha niile anya gburugburu, ọ sịrị ya, “Setịpụ aka gị.” O mere nke a, aka ya dịkwara mma ọzọ.

Luk 6:17-19

Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.

Luk 7:2-10

Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya. Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, “O kwesiri ka i mere ya ihe a. Nʼihi na ọ hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.” Jisọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Ọ bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ọ ga-agwọkwa odibo m. Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.” Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, “Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.” Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.

Luk 7:12-17

Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya. Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.” Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!” Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya. Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!” Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu.

Luk 7:21-22

Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.

Luk 8:2

na ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a chụpụrụ mmụọ ọjọọ site nʼime ha, gwọkwa ha nrịa nrịa: Meri Magdalin onye e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,

Luk 8:22-25

Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ, ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu. Ha gara kpọtee ya na-eti mkpu, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị nʼala nʼiyi!” O biliri, baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe niile dekwara jii. Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”

Luk 8:27-37

Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu. Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.” Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, ọ na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara. Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ zara sị, “Lijiọn,” nʼihi na igwe mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis. Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike. Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nʼime nwoke a pụọ banye nʼime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ niile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nʼime mmiri ebe osimiri riri ha. Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbara ọsọ gaa nʼime obodo na nʼobodo nta niile dị gburugburu ebe ahụ kọsaa ihe mere. Ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe mere. Mgbe ha rutere ebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ, ebe ọ nọdụrụ ala yiri uwe ma nọrọkwa nʼezi uche ya. Egwu tụrụ ha. Ndị hụrụ ka ihe a si mee kọọrọ ha ka e siri gwọọ onye ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. Mgbe ahụ, ndị niile bi na Gerazin na nʼobodo gbara ebe ahụ gburugburu rịọrọ Jisọs ka ọ hapụrụ ha obodo ha, nʼihi na egwu dị ukwuu tụrụ ha. Ọ banyekwara nʼime ụgbọ mmiri ahụ laghachi.

Luk 8:43-48

Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya. O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara. Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.” Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.” Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya. Ọ gwara ya sị, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo.”

Luk 8:49-56

Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.” Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, “Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya.” Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ. Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, “Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra.” Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ. Ma o jidere ya nʼaka, sị, “Nwa m, bilie!” Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.

Luk 9:1-2

Mgbe ọ kpọkọtara ndị ozi iri na abụọ ahụ, o nyere ha ike na ịchị isi nʼebe mmụọ ọjọọ niile nọ na ịgwọ ọrịa dị iche iche. O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa.

Luk 9:6

Ha gara nʼobodo nta niile na-ekwusa oziọma na-agwọkwa ndị ọrịa nʼebe niile.

Luk 9:11

Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. Ọ nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị niile ọ dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.

Luk 9:12-17

Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, “Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara.” Ọ zara ha sị, “Unu nye ha nri ka ha rie.” Ha zaghachiri ya sị, “Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri.” Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.” Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ. Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.

Luk 9:29

Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ụdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya bidoro ịchaa ọcha nke ukwuu.

Luk 9:38-43

Otu nwoke si nʼetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu tie mkpu sị, “Onye ozizi, arịọ m gị ka i lee nwa m nwoke anya, nʼihi na naanị ya bụ nwa m nwere. Mmụọ ọjọọ na-ejide ya mee ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-atụda ya nʼala, na-ese ya ese, na-adọkwa ya adọ mee ka ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ. Ọ dịghị mgbe ọ na-ahapụ ya kama ọ na-echihịasị ya ahụ. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike.” Jisọs zara sị, “Leenụ ọgbọ rụrụ arụ, nke na-enweghị okwukwe! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ, ruokwa olee mgbe ka m ga-anagide ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwa gị nwoke ahụ nʼebe a!” Mgbe ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwadara ya nʼala sesie ya ike, ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba. Ọ gwọrọ nwata ahụ kpọnyekwa ya nna ya. Ebube ukwu nke Chineke tụrụ ha nʼanya. Ma mgbe onye ọbụla nọ na mgbagwoju anya nʼihi ọrụ ọ rụrụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya,

Luk 10:8-9

“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’

Luk 10:19-20

Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.”

Luk 11:14

Otu mgbe, ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya.

Luk 13:10-17

Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.” Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke. Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.” Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?” Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.

Luk 13:32

Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m.

Luk 14:2-4

Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ. Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?” Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa.

Luk 17:5-6

Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!” Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi.

Luk 17:12-19

Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria. Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.”

Luk 18:27

Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.”

Luk 18:35-43

O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme. Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.” O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!” Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!” Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.” Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.” Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.

Luk 22:50-51

Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Ma Jisọs sịrị, “O zuola!” O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya.

Luk 24:6

Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị,

Jọn 2:3-11

Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, “Ha enweghị mmanya.” Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị.” Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.” A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ. Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri. Mgbe ahụ, ọ gwara ha, “Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche.” Ha mekwara nke a. Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche sị ya, “Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a.” Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.

Jọn 2:23

Mgbe ọ nọ na Jerusalem nʼoge Mmemme Ngabiga, ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe ịrịbama o mere kweere na ya.

Jọn 3:2

Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”

Jọn 4:46-53

Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.” Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.” Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.” Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere.

Jọn 5:2-9

Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya. Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ. Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?” Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.” Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.” Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike.

Jọn 6:2

Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.

Jọn 6:5-14

Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?” Ọ jụrụ nke a naanị iji nwalee ya, ya onwe ya mararị ihe ọ ga-eme. Filip zara ya, “Ụgwọ ọrụ ọnwa isii agaghị ezu ịzụta achịcha nke onye ọbụla nʼime ha ga-atatụ naanị ihe ntakịrị.” Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, “Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?” Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ. Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.” Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ. Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”

Jọn 6:19-21

Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha. Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.” Mgbe ahụ, ha nabatara ya nʼime ụgbọ ahụ, ọ dịkwaghị anya ụgbọ ha bịaruru nʼelu ala ebe ha na-aga.

Jọn 8:59

Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.

Jọn 9:1-8

Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?” Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya. Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ. Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya. Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ. Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?”

Jọn 9:32-33

Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”

Jọn 11:39-44

Jisọs sịrị, “Bupunụ nkume ahụ!” Ma Mata, nwanne nwanyị onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya, “Onyenwe anyị, ọ ga na-esi isi ugbu a, nʼihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.” Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na ị kwere ị ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?” Ya mere, ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nʼelu sị, “Nna, ana m ekele gị nʼihi na ị nụla olu m. Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ana m ekwu nke a nʼihi ndị a gbara m gburugburu nʼebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.” Mgbe o kwusiri nke a, o jiri oke olu tie mkpu, “Lazarọs, pụta!” Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”

Jọn 11:47

Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama.

Jọn 12:37

Nʼagbanyeghị ọrụ ịrịbama niile ọ rụrụ nʼetiti ha, ha ekwereghị na ya.

Jọn 14:11-12

Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m.

Jọn 14:13-14

Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.

Jọn 15:7

Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.

Jọn 20:19-20

Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị.

Jọn 20:25-28

Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!”

Jọn 20:30

Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a.

Jọn 21:3-11

Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla. Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs. Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.” Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya. Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha. Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.” Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.

Jọn 21:20-23

Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?”

Jọn 21:25

Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.

Ọrụ Ndị Ozi 1:3

Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.

Ọrụ Ndị Ozi 1:8-9

Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.” Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.

Ọrụ Ndị Ozi 2:2-6

Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe. Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche.

Ọrụ Ndị Ozi 2:17-20

“ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma. Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.

Ọrụ Ndị Ozi 2:22

“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.

Ọrụ Ndị Ozi 2:43

Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche.

Ọrụ Ndị Ozi 3:2-11

Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma. Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ. Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.” O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye. Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.” O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike. Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke. Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke, ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya. Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.

Ọrụ Ndị Ozi 3:12

Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?

Ọrụ Ndị Ozi 3:16

Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.

Ọrụ Ndị Ozi 4:13-16

Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ. Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a. Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.

Ọrụ Ndị Ozi 4:29-31

Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla. Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.” Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.

Ọrụ Ndị Ozi 5:1-11

Ma otu nwoke a na-akpọ Ananayas na nwunye ya bụ Safaịra rekwara ala nke ha. Na nkwekọrịta ya na nwunye ya, o zoro ụfọdụ ego site nʼego ha retara nʼala ha ahụ, weta nke fọdụrụ bịa tọgbọ nʼụkwụ ndị ozi. Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị? Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.” Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere. Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie. Mgbe ihe dịka awa atọ gasịrị, nwunye ya batakwara, ma ọ matabeghị ihe mere di ya. Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?” Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.” Pita sịrị ya, “Gịnị mere unu jiri kpebie ịnwa Mmụọ nke Onyenwe anyị ọnwụnwa? Gee ntị, nzọ ụkwụ ndị buuru di gị gaa lie nọ nʼọnụ ụzọ. Ha ga-ebupụkwa gị.” Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya. Oke egwu tụrụ nzukọ ahụ niile, tụọkwa ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe ndị a.

Ọrụ Ndị Ozi 5:12-16

Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Ha niile na-ezukọ na mgbe ụlọ Solomọn. O nweghị onye ọbụla kwere iso ha ọzọ, nʼagbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-asọpụrụ ha. Ma otu ọ dị, ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwanyị kwere nʼOnyenwe anyị sonyere ha. Nʼihi nke a, ndị mmadụ bupụtara ndị ọrịa nʼokporoụzọ nibe ha nʼute na ihe ndina, ka ọ ga-abụ mgbe Pita na-agafe onyinyo ya ga-adakwasị ụfọdụ nʼime ha. Igwe mmadụ zukọtara site nʼobodo ndị dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị nrịa nrịa, na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu, a gwọkwara ha niile.

Ọrụ Ndị Ozi 5:19-25

Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị, “Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.” Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha. Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ, “Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.” Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta. Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.”

Ọrụ Ndị Ozi 6:8

Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ.

Ọrụ Ndị Ozi 6:15

Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.

Ọrụ Ndị Ozi 7:30

“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.

Ọrụ Ndị Ozi 7:36

O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.

Ọrụ Ndị Ozi 8:6-8

Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ. Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ. Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ.

Ọrụ Ndị Ozi 8:13

Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu.

Ọrụ Ndị Ozi 8:39-40

Mgbe ha sitere nʼime mmiri ahụ pụta, ngwangwa Mmụọ Onyenwe anyị sitere nʼebe ahụ wepụ Filip, onye onozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ; kama ọ gara nʼihu nʼije ya na-aṅụrịkwa ọṅụ. Ebe ọzọ a hụrụ Filip bụ nʼAzọtus. O jegharịkwara nʼobodo niile dị nʼala ahụ, na-ekwusa oziọma ruo mgbe ọ bịaruru Sizaria.

Ọrụ Ndị Ozi 9:3-9

Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu. Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu. Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.” Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla. Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs. Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ.

Ọrụ Ndị Ozi 9:17-18

Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.” Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim.

Ọrụ Ndị Ozi 9:33-35

Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ. Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị.

Ọrụ Ndị Ozi 9:37-42

Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu. Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.” Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ. Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala. O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ. A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.

Ọrụ Ndị Ozi 10:38

Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya.

Ọrụ Ndị Ozi 12:4-11

Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị. Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke. Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche. Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya. Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.” Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie. Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya. Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”

Ọrụ Ndị Ozi 13:8-12

Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ. Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị? Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya. Mgbe onyeisi ahụ hụrụ ihe mere, o kweere, nʼihi na o juru ya anya bụ ozizi nke okwu Onyenwe anyị.

Ọrụ Ndị Ozi 14:3

Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche.

Ọrụ Ndị Ozi 14:8-10

Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla. O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya, were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije.

Ọrụ Ndị Ozi 15:12

Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ.

Ọrụ Ndị Ozi 16:25-27

Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara. Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya.

Ọrụ Ndị Ozi 19:11-12

Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche. Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.

Ọrụ Ndị Ozi 20:9-12

Otu nwokorobịa a na-akpọ Yutikọs nọdụrụ ala nʼoghereikuku, ọ bụ onye oke ụra bidoro ịtụ dịka Pọl na-ekwu okwu ruo oge dị anya. Mgbe ọ dara nʼoke ụra a, o sitere na nʼụlọ elu nke atọ dapụ, daa nʼala. Mgbe e buliri ya, ọ bụ onye nwụrụ anwụ. Pọl rituru nʼala selite ya elu jikụọ ya. Ọ sịrị ndị gbakọrọ nʼebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.” Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya. Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.

Ọrụ Ndị Ozi 28:3-6

Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya. Mgbe ndị obodo ahụ hụrụ agwọ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nʼaka ya, ha gwarịtara onwe ha, “nʼezie a, nwoke a bụ ogbu mmadụ, a naghị eji ọkụ enyo ya. Ọ bụ ezie na azọpụtara ya site oke mmiri, ma ikpe ziri ezi ekweghị ka ọ dị ndụ.” Ma Pọl fepụrụ agwọ ahụ nʼaka ya, mee ka ọ daba nʼọkụ, ọ dịghịkwa ihe mere ya. Ha na-ele anya ma aka ya ọ ga-aza, maọbụ na ọ ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na o nweghị ihe mere ya, ha gbanwere obi ha bido na-ekwu, na ọ bụ chi.

Ọrụ Ndị Ozi 28:7-9

Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pobilios otu nwoke onyeisi na-achị agwa etiti ahụ. Ọ nabatara anyị nke ọma, lee anyị ọbịa ụbọchị atọ. Nʼoge ahụ, nna Pobilios nwere ahụ ọkụ na afọ ọsịsa, Pọl banyere nʼime obodo gaa leta ya, kpeere ya ekpere, bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịkwara ya mma. Mgbe nke a mechara, ndị niile nwere nrịa nrịa nʼagwa etiti ahụ bịakwara, a gwọkwara ha.

Ndị Rom 10:17

Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.

Ndị Rom 15:19

nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst.

1 Ndị Kọrint 1:22-24

Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe. Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.

1 Ndị Kọrint 2:1-5

Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya banyere ihe omimi niile nke okwu Chineke. Nʼihi na ekpebiri m na naanị ihe m ga-ama nʼetiti unu bụ naanị ihe banyere Jisọs Kraịst na mkpọgbu a kpọgburu ya nʼelu obe. Abịakwutere m unu nʼọnọdụ adịghị ike, oke ụjọ na ahụ ịma jijiji. Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya. Ka okwukwe unu ghara ịdabere nʼamamihe mmadụ, kama ka ọ dabere nʼike Chineke.

1 Ndị Kọrint 12:7-11

Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ. Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.

1 Ndị Kọrint 12:28-31

Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube? Ha niile ha nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ha niile ha na-asụ nʼolu dị iche iche? Ha niile ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị iche iche? Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma.

1 Ndị Kọrint 13:1-2

A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda. A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla.

1 Ndị Kọrint 14:1-6

Ka ịhụnanya bụrụ isi ihe unu na-achọ. Chọsienụ onyinye nke Mmụọ Nsọ ike, nke ka nke onyinye inwe ike ibu amụma. Onye ọbụla na-asụ asụsụ ọ na-amụghị amụ, bụ Chineke ka ọ na-agwa okwu, ọ bụghị mmadụ. Nʼezie, ọ dịghị onye na-aghọta ihe ọ na-ekwu; nʼihi na okwu ọ na-ekwu bụ ihe omimi site nʼike Mmụọ Nsọ. Ma onye ọbụla na-ebu amụma na-ezisa ozi na-enyere ndị mmadụ aka ito eto. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu. Ya mere, onye ahụ na-ebu amụma na-enyere chọọchị aka, ma onye ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere naanị onwe ya aka. Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu niile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche; ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu niile enwee onyinye ibu amụma. Nke a bụ nʼihi na onye ahụ na-ebu amụma bara uru karịa onye na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, ka e nwee ike wulie chọọchị. Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ unu na-adịghị aghọta, ole uru m baara unu, ma ọ bụghị ma m na-ekwu okwu banyere ihe ekpughere gosi m, maọbụ ihe niile m maara, maọbụ ihe gaje ime, maọbụ ihe nkuzi?

1 Ndị Kọrint 14:22-25

Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe. Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a? Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie. Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”

1 Ndị Kọrint 14:39

Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, unu egbochikwala onyinye nke ịsụ nʼire dị iche iche.

2 Ndị Kọrint 12:12

Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ.

Ndị Efesọs 3:20

Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ imebiga ihe nʼoke karịa ihe niile nke anyị rịọrọ, maọbụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nʼuche anyị, site nʼike ya nke na-arụ ọrụ nʼime anyị,

Ndị Hibru 2:4

Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị.

Ndị Hibru 11:1

Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya.

Ndị Hibru 11:6

Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.

Jemis 1:6

Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.

Jemis 5:14-16

Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya. Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.

Jemis 5:17-18

Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii. Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.

Mkpughe 1:12-16

Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ. Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya. Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike. Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị. O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.

Mkpughe 21:1-2

Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.

Igbo - Ìgbò - IG

IGBCB'20 - Igbo Contemporary Bible - 2020

This Bible text is from Biblica Open Igbo Contemporary Bible 2020
https://open.bible/bibles/igbo-biblica-text-bible/
provided by: Biblica Inc, available by Creative Commons CC-BY-SA-4.0,
and this new compilation is shared as www.creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0.
Languages are made available to you by www.ipedge.net